Ọkụọgbụgba erefuola ego ruru nde naira 506 n'Anambara

Ebe foto si, Getty Images
Akụ na ụba ruru nde naira 506 abụrụla ihe etufuru etufu n'ọkụ ọgbụgba 68 merela na Anambara site na ọnwa Disemba 2017 ruo n'ọnwa Epreelu 2018,
Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mpinyụ ọkụ n'Anambara steeti bụ Martin Agbili kwuru nke a n'emume ncheta ndị ọrụ mmenyụ ọkụ na mbauwa niile n'Awka
Isiokwu emume a bụ:"Technology in Emergency Response and Support for Firefighters''.
Nke a pụtara n'asụsụ Igbo, iji Teknụzụ kwado ndị ọrụ mpinyụ ọkụ.

Ebe foto si, Getty Images
Agbili kwukwara na ya na ndị otu ya zọpụtara akụ na ụba ruru ijeri naira 11.2 n'oge ahụ maka sọkwụ sọkwụ ha jiri bia zaa oku mpinyụ ọkụ.
O kwuru na emume na-enye oher iji wee kọwapụta mmeri nakwa nsogbu ndị ọrụ mpinyụ ọku na-enwe n'ọru.
Agbili jikwa ohere cheta ndị otu ya nwụrụ ebe ha na a pinyụ ọkụ ,na-arịọkwa ka enye ndị be ha ezigbo ego nkasiobi makana ego ha na-enye ndị na-arụ udiri ọrụ na-etinye ndụ ha nsogbu.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ rịọkwara ka-enye kwuo ha ngwọ ọrụ ha ga-eji na-arụ ọrụ karia nke ha rugoro arụ.
Agbili kenekwara Gọvanọ Willie Obiano maka nkwado ọ na-enye ya na ndị otu ya.








