Ndị uweojii akọwala ihe IGP ejighị za oku sịnetị kpọrọ ya

Ebe foto si, NPF Facebook / Getty
Ebe ndị ụlọomeiwu nke ukwu bụ Sineti na-ewe iwe ihe mere Ibrahim Idris jirị gba ha nkiti n'oku ha kpọrọ ya, ndị uweojii na-akọwa ihe mere.
Ha dere n'ụfọdụ ozi n'elu Twitter na Idris so onyeisiala mee njem ọrụ n'ụbọchị ha ziri ya ozi ya bịa ma na ọ gbara mbọ zi ga ndị nnọchịtere ya anya.
Lee nkọwa ha ebe a:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Cheta na ndị ụlọọrụ sineti akpọkuola onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris ugbo atọ mana Ibrahim abịaghị na onwe ya chacha, kama ọ na-ezite mmadụ.
Mana ndị sineti chọrọ ịhụ ya onwe ya ka ha na-abụghị onye ọ na-ezite nke mere na ha kpọrọ Ibrahim onye iro megide ọchịchị onye kwuo uche ya, were kwukwaa na o kwesighi ịnọ n'oche ọchịchị ahụ.
N'aka nke ya, onyeisiala ndị uweojii zaghachiri iwu ahụ ndị sineti tiri ma kwuo na ya emeghị ihe ọjọọ ọbụla ma ya adakwaghị iwu ọbụla.
Ọ kọwara na osote ya bụ AIG ndị uweojii nwere ikike nke akwụkwọ nyere ịnọchite ya ebe ọbụla nakwa n'ihe ọbụla a na-eme, ya bụ na ọbụghị iwu na ọ bụ ya gara zaa oku ahụ n'onwe ya.
Ndị sineti na-akpọ ya ka ọ bịa zaa ọnụ ya gbasara ihe na-eme otu onye n'ime ha bụ sinetọ Dino Melaye bụ onye ndị uweojii nwụchiri.

Ebe foto si, GETTY IMAGES/DINO MELAYE
Mana o kwuru na ya emeghi ihe ọjọọ ọbụla maka ndị ụlọikpe kpebiri na Melaye adịla ike ịga ụlọikpe tupu ndị uweojii akpọrọ ya gawa Lokoja ebe a kpụpụrụ ya ụlọikpe.
Ibrahim kwuru na ihe ndị sineti na-eme bụ iji mee ka agharị ikpe ikpe kwụ ọtọ.
N'okwu ya, "Ihe ndị sineti na-eme bụ ịta m amusu na ịkpacha anya chọ ịkwụsị ikpe ziri ezi" n'ihi na ndị a na-enyocha bụ ndị omekome kpọrọ Melaye aha dịka onye so ha kpaa nkata ọjọọ ma jide ngwọagha ndị machibidoro iwu.
N'akwụkwọ ụlọọrụ ndị uweojii dere, o kwuru na, "Onyeisi ndị uweojii agaghị adara mbọ mmadụ ọbụla maọbụ otu onye maọbụ mmadụ abụọ na-agba ịhụ na e mebiri ikpe kwụ ọtọ.
"Nke a mere na ndị uweojii Naịjirịa enweghi onye ha ga-arịọ mgbaghara ọbụla maka na ha ana-ahụ na-akwalitere iwu Naịjirịa, ịgba mbọ na mmdụ niil rubere isii nye iwu obodo nke kas=chasị agbanyeghi ọnọdụ onye ahụ n'obodo."
Obi adịghị ndị sineti mma maka na otu onye n'ime ha bụ Dino Melaye na-agabiga mmegbu n'aka ndị uweojii nke kpatara ha ji akpọrọ onyeisi ndị uweojii ka ọ bịa zara ọnụ ya gbasara nsogbu Melaye mana o zigara mmadụ.

Akụkọ ga-amasị gị:











