IGP enyela iwu ka echesie ụlọomeiwu ukwu ike

Ọfọ ndị senate

Ebe foto si, Nigerian Senate/Facebook

Nkọwa foto, Ike Ekweremadu nọchiri Bukola Saraki na nzukọ ebe a bịara buru ọfọ a

Isiụlọọru ndị uweojii na-ekwu na ha ahụla ọfọ ndị ụlọomeiwu ndị agboro wakporo Sineti zuru, ụbọchị Wenesde, abalị 18 nke ọnwa Eprelụ, 2018.

Onyeisi ndị uweojii bụ Idris Ibrahim, nyekwara iwu ka ndị uweojii tinyekwuo uchu na nchekwa ụlọomeiwu dịka ozi a na-apụta.

Isi ụlọọrụ ndị uweojii kwuru nke a n'akwụkwọ ozi nke osote ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Naijiria bụ SP Aremu Adeniran, tinyere aka sị na a hụrụ ọfọ ahụ n'okpuru akwa ụgbọala nke a kpọrọ 'Flyover' na bekee dị na City Gate, n'Abụja ebe otu nwa amadị hụrụ ya ma kpokuo ndị uweojii.

N'ụbọchị Wenesde, ndị Sineti nyere ndị uweojii na ndị nchekwa ndị ọzọ otu ụbọchị ka ha chọta ya bụ ọfọ na-efu.

Ozi ahụ kwuru si: "Onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris mere ngwangwa hiwe otu ọkpọka na nyocha ma nye ha iwu ka ha gbachie isiobodo Naijiria mee ezi akwụsị-enyochaa iji nwụchị ndị omekome ahụ ma nata ha ọfọ.

"Ndị uweojii wakpokwara ebe ndị omekome na-anọkarị nke mere ka ndị omekome ahụ hapụ ọfọ ahụ n'okpuru akwa ụgbọala dị na City Gate gbalaga, ebe otu nwa amadi hụrụ ala nna anyị n'anya hụrụ ya ma bekuo ndị uweojii."

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ