Ndị omekome nwere ike iwakpo Asọ Rọkụ -Onye ọnụ na-eru n'okwu

Ebe foto si, Nigerian Senate/ Facebook
Ihe ahụ mere na sinetị taa ebuliela arụmụka n'akụkụ Naịjirịa niile ebe ndị mmadụ na-ahụ ya dịka mmehie n'akụkụ ndị ọrụ nchekwa.
Nke a bụ maka na ndị mmadụ na-ekwu na nchekwa sineti atọghị atọ mere ndị mmadụ ga-eji wakpoo ụlọahụ buru ọfọ ma laa n'udo.
Ndị sineti enyela ndị uweojii na ndị nchekwa ndị ọzọ otu ụbọhị ka ha chọta ya bụ ọfọ na-efu.
BBC Igbo gwara otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Okechukwu Nwoke okwu. Okechukwu kwuru na ihe a bụ ihe ihere nye Naịjirịa ma nye ndị ọrụ nchekwa.
N'okwu ya; "Ebe ọ bụ na ndị nwere ike ịgafe ndị nchekwa niile nọ na sineti we rue ebe ha na-eme ọgbakọ, ọ pụtara na ndị omeokome nwkwara ike iwakpo isi ụlọ ebe onyeisiala bi bụ Asọ Rọk."
N'akụkụ nke ya, onye ọkaiwu bụ Nwabueze Ugwu kwuru ka a chụọ ndị ọụ nchekwa niile n'ọrụ maka otu ihe a mere.
Ụmụ Naịjirịa ndị ọzọ nọ n'igwe twitter na-ekwu uche ha gbasara ya bụ ihe.
Fabulos Gloria dere na ya chee na ala Naịjirịa agafela omume ihere a nke bụ na ndị mmadụ bu ọfọ ndị sineti gbapụ ọsọ ma onweghi onye kwụsịrị ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ibu Thomas kwuru na ihe kacha enye ya nsogbu n'ihe a mere bụ na ndị uwojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ nọ n'ụlọ ahụ enweghi ihe ha mere. N'okwu ya ; "Mbụ bụ ndị agha na ihe gbasara ndị ọchụehi mana ugbua bụzi ndị uweojii na-enyere ndị omekome aka n'ọchịchị onye kwwuo uche ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Onye bubu osote onyeisiala Naịjirịa bụ Atiku Abubakar dere na mwakpo mere na sineti taa abụghị ezi ihe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Joe Abah na-ajụ kedụ ka mmadụ ga-esi banye n'ụlọọrụ sineti buru ọfọ ha, ọ bụkwaranụ onye nwere ebumnobi igbu mmadụ, ha kara ịbanye gbusie ndị mmadụ laa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Ihe a n'ọtụtụ ndị ọzọ ka ụmụ Naịjirịa na-ekwu mana otu ihe bụ na onyeisiala Muhammadu Buahri bụ onye nọ na London ugbua enwebeghi ihe o kwuru gbasara.

Akụkọ ga-amasị gị:









