Sinetị: Ihe mere na sinet bụ arụ megide Naijiria

Ebe foto si, Nigeria Senate/Twitter
Ụlọomeiwu sinetị ewepụtala akwụkwọ ha jiri tinye ọnụ n'ihe mere ebe ahụ taa.
N'akwụkwọ ahụ nke onyeisi mgbasaozi na sinetị bụ Aliyu Sabi Abdullahi binyere aka na ya, o kwuru na ihe mere na sinetị taa bụ arụ megide mba Naịjirịa maka na ndị ahụ batara na sinetị chọrọ ichutu otu ngalaba ọchịchị Naịjirịa.
N'aka nke ọzọ onyeisi sineti bụ bukola Saraki edeepụtala akwụkwọ ikwu ebumnobi ya gbasara ihe mere taa.
O kwuru na obi dị ya ụtọ etu ndị sineti siri na-ekweghi ka mkpamkpa ahụ kwụsị ha ọrụ ha.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Ndị omeiwu ahụ mechara nwee ọgbakọ ha mana ha ejighi ọfọ ahụ na-efu we mee ya.
Ndị ụlọomeiwu nta bịara sonyere ndị sinetị taa nwee ọgbakọ maka ya bụ ihe mere nie ha mechara we nye onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Ibrahim idris na onyeisi ndị SSS bụ Lawan Daura otu ụbọchị ịchọta ya bụ ọfọ na-efu efu.
Nke a na-eme ụbọchị ole ndị sinetị kwuchara ka a chụọ ndị isi ọrụ nchekwa niile na Naịjirịa.
Ọtụtụ ndị mmadụ ekwuola okwu maka ya bụ ihe mere, ndị otu pati Sinetọ Ovie bụ APC akatọla ya bụ mkpamkpa.
Ha dere ya n'akara twitter ha taa:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
N'akụkụ nke ha, otu pati na-anghị n'ọchịchị bụ PDP etinyekwala ọnụ ha n'ihe ahụ mere wee katọọ ya.
Site n'ozi ha depụtara n'akara twitter ha, ha gwara ụmụ Naịjirịa ka ha lebaa anya na mwakpo nakwa ahụhụ nke otu pati APC na-ata ndị omeiwu Naịjirịa na ndị isi hanke gunyere ikwu ka ndị uweojii jide onye sịnetọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

End of X post, 3
BBC Igbo gbara onye ọkaiwu Nwabueze Ugwu ajụjụọnụ gbasara ihe ahụ mere, o kwuru na ihe bụ ihe ihere nye Naịjrịa na iwu Naịjirịa.
N'okwu ya; ndị ụlọomeiwu mere nkeọma wee jiri ọfọ ọzọ we mee ọgbakọ maka na iwu Naịjirịa ekwughi na ọ bụrụ na ọfọ adighị, ha agaghị ejili ọfọ ọzọ mee ọgbakọ.
Mana o kwuru na ndị gọọmenti etti kwesiri ịhụ ndị isi ọrụ nchekwa niile dịka ndị ụlọomeiwu si kpọọ oku ya ụbọchị gara aga.
N'aka nke ọzọ, onye ọnụ na-erụ n'okwu n'ihe gbasara ọchịchị na ndọrọndọrọ bụ Okechukwu Nwoke gwara BBC Igbo na ihe a gosiri na ọchịchị edoghi ndị APC anya.
Nwoke kwukawara na ụmụ Naịjirịa na-ele anya ihe ga-eme onye sinetọ ahụ wakporo ụlọomeiwu taa n'ihi na ihe o mere kwesiri itu nga.

Akụkọ ga-amasị gị: