Ihe ga-eme ka otu nchekwa ndị IPOB na nke ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ rụkọọ ọrụ - Aloy Ejimakor

Ebe foto si, Getty/Ipob
Otu Ipob ekwuola na ha nwere ike ịkwado otu nchekwa ọhụrụ bụ nke ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ na-atule ihibe.
Aloy Ejimakor, onye bụ ọkaiwu IPOB nakwa ọkaiwu Nnamdi Kanu, kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ekwentị n'ụbọchị Tọzde.
Ejimakor kwuru na otu nchekwa nke a ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ chọrọ ihibe abịaghịzi n'oge maka na o teela aka a tụrụ anya ka ha mee ya mana ha emeghị ya.
Mana dịka ha chọrọ ihibe ya ugbua, ọ bụrụ na obi ha dị ọcha, IPOB na Nnamdi Kanu ga-akwado ya.

Ebe foto si, Getty Images & NPF Facebook
O kwuru sị: "Okwu gbasara ihibe otu nchekwa ọhụrụ dị mma, kama ya abụkwana ihe e ji eme 'politics'"
"Ihe Nnamdi Kanu ji hibe Eastern Security Network abụghị maka 'politics' kama ọ bụ iji chekwaa ndụ na akụnụba."
"Ọ bụrụ na ndị gọvanọ na-ekwu eziokwu gbasara otu nchekwa a, ọ bụrụkwa na ọ bụghị ihe e ji eme ndọrọndọrọ ọchịchị, eji m n'aka na Nnamdi Kanu nakwa IPOB ga-akwado ya."
Kama Ejimakor kwuru na ọ ga-ara ahụ ịgwa Nnamdi Kanu na IPOB ka ha kwasaa otu Eastern Security Network iji nye ohere ka otu nchekwa nke gọọmentị malitezie ọrụ.
"Cheta na IPOB agbasaghị naanị ndị Igbo," Ejimakor kwuru.
"IPOB bụ maka steeti niile so na mpaghara 'Eastern Nigeria' nke ochie."
"Eastern Security Network nọcha na mpaghara ndị a, ya mere ọ ga-eji hịaa ahụ ịkwasa otu ahụ."
Eastern Security Network ọ ga-akụpụ otu nchekwa ọhụrụ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ na-achọ ihibe?

Ndị Gọvanọ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ekwetela ihibe otu nchekwa nke ha bụ ndị ga-enwe ụdị akwa nke ha ma na-ebukwa egbe.
Ọ bụ onyeisi otu 'South-East Governors' Forum' nakwa Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Dave Umahi gwara ndị ntaakụkọ nke a n'ụbọchị Tuzde, oge e mechara ọgbakọ nchekwa pụrụ iche bụ nke e mere n'ịntaneetị.
Nke a na-abịa dịka onyeisi otu 'Indigenous People of Biafra' (IPOB) bụ Nnamdi Kanu hibere otu nchekwa nke ha ma kpọọ ya 'Eastern Security Network'.
Umahi kwuru sị: "Ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ nwere ọtụtụ ọgbakọ gbasara nchekwa mpaghara anyị."
"Ugbua, anyị na-atule ụdị akwa ndị ọrụ nchekwa ahụ ga-eyi bụ nke ga-abụ otu ụdị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ niile."
"Anyị na-atulekwa ụgbọala ha ga na-eji arụ ọrụ, ọ ga-abụkwa otu ụdị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ."
"Anyị akpakwaala gbasara etu a ga-esi enye ndị ọrụ nche a ọzụzụ zuru oke iji hụ na ha rụrụ ọrụ ha nke ọma, nke bụ ichekwa ndụ na akụnụba ndị mmadụ."
"N'izuuka olemole na-abịanụ, anyị ga-ewepụta akwa ndị nche a ga na-eyi iji wulite ọnọdụ nchekwa nke mpaghara anyị."
Eastern Security Network nke ndị IPOB

Ebe foto si, Getty/Ipob
Cheta na IPOB nwere otu nchekwa nke ha kpọrọ 'Eastern Security Network'.
Onyeisi IPOB bụ Nnamdi Kanu kwuru na ihe o ji hibe otu ahụ bụ maka enweghị nchekwa dị n'ala Igbo.
Mazi Kanu kwukwara na ndị Gọvanọ achọghị ime ihe ọbụla gbasara enweghị nchekwa, dịka ndị gọvanọ Ọdịda Anyanwụ si mee ma hibe otu nchekwa a kpọrọ 'Amotekun'.
Ugboro ugboro ka Mazị Kanu na-ekwu na ndị ọchịehi Fulani na-ala ndụ ọtụtụ mmadụ n'iyi n'ala Igbo
Mana dịka Umahi na-ekwu okwu n'ụbọchị Tuzde, ọ rịọrọ arịrịọ ka ndị mmadụ kwụsị ikwu okwu nwere ike ibute ọgbaaghara n'etiti ndị Igbo na ndị agbụrụ ọzọ.
Umahi kwuru na "okwu ndị ahụ na-etinye ndụ ndị Igbo bi na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa na nsogbu."
"Ihe karịrị ndị Igbo mmadụ nde iri na otu (11 million) bi na mpaghara Ugwu."
"Ihe karịrị mmadụ nde atọ bi na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Naịjhirịa."
"Okwu ndị IPOB na ndị Fulani ọchịehi nwere ike ịmụnye ọkụ ga-agba ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa."
N'Ebonyi steeti

Umahi kpọkwara oku ka ndị niile welitere isi n'Ebonyi steeti tinye mma ha n'ọbọ ma kwụsị esemokwu nke na-akpata ọke ịkwafu ọbara na steeti ahụ.
O kwuru na ihe na-eme n'Ebonyi gafere okwu ndọrọndọrọ ọchịchị, n'ihi na ọtụtụ ndị mmadụ na-achọ inye Ebonyi steeti nakwa ya onwe ya aha ọjọọ.
"Mana anyị akpọọla ọgbakọ ndị welitere isi na steeti anyị, Sam Egwu, Sịnetọ Anyim Pius Anyim, onye ọbụla tinyezie mma ya n'ọbọ. Anabatakwala m mkpebi ha nyere m," Umahi kwuru.













