Nchekwa ala Igbo: Ụzọ ise ndị Igbo si echekwa ogige ha mgbe gboo ndị ụgbụa kwesiri mụta

Mmọnwụ na ndị ọgbọ
    • Onye dere ya, Chioma Obianinwa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist, Igbo

Nchekwa obodo so n'otu ihe ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ugbua, ọkachasị etu akukọ si mpaghara dị iche iche na Naịjirịa metụtara mwakpo na ogbugbu mmadụ aghara aghara.

Mana, ọbụghịkwanụ sọsọ ugbua ka a malitere ikwu maka nchekwa.

Mgbe elu ka bụ ala ọsa n'ala Igbo, ezi nchekwa obodo dị makana ndị mmadụ na-atụ ụjọ izu oshi, ịbanye be mmadụ n'ike maọbụ zọkọrọ oke na-abụghị nke ha.

Nke a bụ makana ha ma na ihe ga-eso ya abụghị ihe eji ọnụ akọcha.

Nze Olueze Ukaejuoha Duruagwu bụ onye omenaala Igbo na-amasị nyere BBC aka kpọpụta ụfọdụ atụmatụ nchekwa ndị gboo ji eche ndụ ha.

Nze Duruagwu kpọpụtara atụmatụ ise ọ sị ndị agbaọhụrụ kwesiri ịmata maka.

Lee ha ebe a:

1: Onye nwere ihe ya

Ịgọ ọfọ

Nke a pụtara ihe mmadụ idiri ya.

Ihe a ọ sị eji eme ka ihe mmadụ dịrị ya bụ atụmatụ ọ kpọrọ na Bekee ka "security assurance policy".

Nke a pụtara ọtụmọkpọ n'asụsụ igbo.

Iji maatu ebe nchụaja, makana onweghị ka a ga-esi si na ndị Igbo enweghi nchekwa nke mmụọ.

A na-etinye ya n'ụlo, n'ulọ ọrụ maọbụ n'ubi.

Nze Duruagwu sị na o nwere nke a na-akpọ Ihima.

Onye ọbụla biara be mmadụ bia were ihe ya na-agwaghị ya agwa, ihima ahụ ga-ejide ya, mee ya ka o buru ihe ahụ o zutere n'isi na-agagharị agagharị n'ụlọ ahụ ruo mgbe onye nwe ụlọ batara jide onye ahụ megharịa ya.

O kwuru na a ka na-eme ihe a ruo taa.

Ọ sị: "Mgbe ụfọdụ o nwere nke ga-abụ etinye ya, iburu ihe ọjọ n'obi rute bee mmadụ, o mee gị ichezọ ajọ ebumnobi ahụ."

Ọsịkwa na o nwere nke a na-akpọ Igbudu, a na-eji achara eke ya eke tụọ ya n'elu maọbụ lie ya n'ala. "I buru ihe ọjọ fete n'obodo ahụ ruo ebe ekere ihe ndị a, ọgwụ ahụ agaghị adi ire."

2: Mmọnwụ

Mmanwụ ndị Enugwu-Ukwu
Nkọwa foto, Mmanwụ ndị Enugwu-Ukwu

Mazi Duruagwu kwuru na mmọnwụ dịka ndị uweojii mgbe ahụ.

Ọ sị na n'ebe dika Enugwu ukwu nakwa ụfọdụ ebe ndị ọzọ na-abụ mmadụ ria ukwu ụdara, ghọrọ ụdara maọbụ ma ya iche mmaọnwụ ga -abịa jide gị.

Ime arụ n'obi, "ọ bụ mmaọnwụ ga-abia bia maa gị iwu.

Ha anaghị abia na nkịtị, ị ga-elekọta nke ọma makana ha ji chi ha biagasi

Ha nwereike iru otu narị i ga-enyecha ji na ọkụkọ ole na ole ma ha si bee gị pụwa ma imeghị ya, ntaramahụhụ ga-adịrị onye ahụ.

3: Ndị ikpe

Ndị isi bịara ya bụ emume

Nke a gụnyere ndị Nze. Ha na-ekpe ikpe ma maa onye mebiri iwu ikpe.

Iwu ha na-enyeaka echekwa obodo.

4: Arusi

Nke a pụtara arụ kwụsi n'obodo.

Duruagwa kwuru na arụsị nọ n'obodo ọbụla na-enye aka echekwa obodo nakwa ndị nọ n'obodo ahụ.

5: Di ọgụ

Ndị mgba

Ndị a bụ ndị na-aga ọgụ ma ọgụ dapụta n'obodo tumadi ọgụ agbụrụ na agbụrụ ka ha wee chekwa onodo.

A na-akwado ndị a na ọnọdụ nwoke ka ha wee gaa ọgụ ma lọta.

Imaatụ, eme ha ihe ndị a, ima ha mma maọbụ gba ha egbe ọ gaghị emetụ ha. Ha nwereike iji ọlụọlaa.

Iwu bụ na a ga-edopuriri ha iche ma ha lọta ọgụ maka nhicha makana aka ha bụ ọbara ọbara. Emeghị nke a, ha nwereike ibido gbuwe ndị obodo ha amaghị ama.

Ndị ọgbọ na-eche agụ akpọrọ age grade na beekee. Ha na-eso aga ya bụ ọgụ maka ichekwa obodo ha.

O nwere ihe mmụta dị n'ụzọ ochie ndị a?

Otu nchekwa ndị

Ebe foto si, Twitter

Dịka ndị Yoroba na-ewepụta nchekwa ọhụrụ nke ime obodo a kpọrọ "Amotekun" nakwa nke ndị ugwu.

Duruagwu kwuru na ọ ga-adi mma ka alaghachi azụ were ọlụọlaa, onye nwere ihe ya, arụsị nakwa ikwado ndị ọgbọ na-eche agụ ọfụma ma duo ha n'iyi.

O kwukwara na ihe ndị a ga-enye aka hụ na arụ niile na-eme n'ala igbo kwụsịrị.

Duruagwu kwuru na o nwegodu ihe mmụta dị n'ụzọ ochie ndị a, ndị ọchichị agaghị achọ iwere ya mee ihe makana ọ ga-aghọ ha ahia.

Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ na onyeisi ndị uweojii

Ebe foto si, Facebook/Ugwuanyi News Update

O kwuru na ọ bụ ndị nwe obodo ga-echekwa obodo, ihe dịrị gọọmenti bụ iwere ego kwado ihe ndị obodo na-eme.

O nwere ọghọm dị n'ụzọ ochie ndị a?

Mmọnwụ Coal Camp
Nkọwa foto, Mmemme ncheta mbilite n'ọnwụ kraist mere n'ụdị ọpụrụiche n'Coal Camp Enugwu ebe ụdị mmanwụ karịrị nari abụọ gbara n'ọgbọ.

Duruagwụ kwuru na ọ bụ ndị agbara ọhụrụ ga-anahụta ọghọm na ya maka ha na -ekwu na ha echeghariala ma na-akatọ ụzọ ndị a bara ezigbo uru rukwa taa.