Breastfeeding: Lee nrị Igbo ga-eme ka ara nwaanyị mụrụ nwa gbaa mmiri zamzam

Nwaanyị na-enye nwa ara n'ilo

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ihere o kwesiri ime nwaanyị na-enye nwa ya ara n'ilo?

E nwere ọtụtụ nri a na-agwa ụmụ nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ka ha na-eri iji hụ na mmiri ara ha na-agba nke ọma.

Ụdị nri ndị nwaanyị ga-eri ga-enye ya na nwa ya ọhụrụ ahụ ike.

Nke a mere ka ọtụtụ ụmu nwaanyị na-eri ihe di iche iche.

BBC News Igbo kpọtụrụ ọkammụta n'ihe gbasara ihe oriri bụ Florence Uchendu na okammụta maka mmiri ara nwaanyị bụ Maryam Sanuth ka ha kọwara ụmụ nwaanyị maka ụdị nri ha kwesiri ị na-eri ịhụ na mmiri ara ha gbapụtara nke ọma.

Etu ahụ ụmụ nwaanyị si emepụta mmiri ara.

Ime ara nwaanyị

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Eserese a gosiri ka mmiri ara nwaanyị si agbapụta n'ara ya

Nri ndị na-eme ka ara nwaanyị na-agba ọfụma bụ 'galactogogues' n'okwu ndị sayensi.

Maryam Sanuth bụ ọkammụta n'ihe gbasara nri depụtara na websaịt ya sị na ọ bụ n'ihe dịka izuụka nke iri abụọ n'ime nwaanyị ka ahụ mmadụ na-ebido imepụta mmiri ara.

Ọ kọwara na n'oge a ka ị ga-achọpụta na ara nwaanyị ebuwala ibu.

Ozugbo nwaanyị mụchara nwa, mmiri ọgwụ ahụ bụ 'hormone' n'asụsụ Bekee bụ 'prolactin' na 'oxytocin' na-ebido imepụta mmiri ara.

Lee nri nwereike inye aka bupụta mmiri ara nwaanyị

Nri e jiri mmiri ọkụ sie

Ji mmiri ọkụ na azụ

Ebe foto si, Ntanta Delicacies/ Instagram

Ụdị nrị ndị a dịka:

  • Mmiri ọkụ ọkpọrọ
  • Mmiri tii (Tea)
  • Ji mmiri ọkụ
  • Ofe nsala
  • Mmriri ọgwụ

Florence Uchendu kwuru ọ dị mkpa ka nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ na-aṅụ mmiri ọkụ maka na mmiri ọkụ nwere nnukwu ọrụ n'ịgbapụta mmiri ara.

Aha onyonyo, Uru dị n'akwụkwọ nri

O kwukwara sị "a ga-etinye ụda, azụ na ụzịza nke ga-eme ka ọbara nọ n'akpa nwa nwaanyị pụtacha".

Ọ kọwara na ọ bụ odozi ahụ na odoma nọ n'ime ihe ndị a na-eme ka ara nwaanyị na-agba nke ọma.

Akamụ

Akamụ

Ebe foto si, Chefmide/Instagram

Nkọwa foto, " Nwaanyị na-enye nwa ara kwesiri iṅụ akamụ etinyere mmiri ara ehi nke ọma" - Florence Uchendu

Sanuth kwuru na akamụ dịkwa ezigbo mkpa ma ha mee ya ka ọ gbaa miri.

Uchendu n'otu aka ahụ kwadokwara akamụ maka ndị na-enye nwa ha ara wee sị, "Ọ ga na-aṅụ akamụ etinyere mmiri ara ehi nke ọma kama ya etinyela shuga nke ga-eme ka ọ tọọ ụtọ, n'ihi na ọ nwereike ịsa nwatakịrị ana-enye ara afọ".

Ọ kọwara na odozi ahụ 'protein' dị na mmiri ara ehi dị mkpa maka ụmụ nwaanyị na-enye nwa ha ara.

'Ginger' na 'Garlic'

Garlic

Maryam Sanuth kwuru na galiki (garlic) na enyere aka nke ọma ma sị ka ụmụ nwanyị na-enye nwa ara na-ata ya na ndụ.

O kwukwara na jinja (ginger) dịkwa mma ma dekwa sị ka ụmụ nwaanyị gbarie ya ma ṅụọ ya na mmiri na adịchaghị okụ.

Akamụ Bekee (Oats)

Sanuth depụtara na ọtụtụ faịba (fibre) na ihe ndị na-edozi ahụ juputara na nri ootu nke mere na ọ dị mkpa ka ụmu nwaanyị di ime na-eri ya oge niile.

Akamu Bekee oat'

Ebe foto si, Getty Images

Akị awụsa na akị dị iche iche

Akị awụsa

Ebe foto si, Instagram/Utakaegbe

Nkọwa foto, Akị awụsa nwere mmiri nwereike inye aka gbapụta mmiri ara nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ

Sanuth kọwara na akị awụsa na akị dị iche iche juputara na 'fatty acids' na nnye ike 'calories'.

Ọ kọwara na iri alọọma ugboro atọ n'otu ụbọchị ga-ebulite ọgbụgba mmiri ara nwaanyị ma mee kwa ka abụba juputa na mmiri ara ya.

Ahuekere
Nkọwa foto, E nwere akị dị iche iche nke bekee na-akpọ 'nuts' na-enyere ụmụ nwaanyị na-enye nwa ara aka.

Maryam Sanuth kwukwara na nyocha gosiri na moringa na-ebulite ọgbugba mmiri ara nwaanyị ruo passenti 100%.

Akwụkwọ Moringa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Akwụkwọ nri moringa

O kwukwara na ọ bụ nanị ngaji moringa abụọ a kwọrọ akwọ nanị ga nwaanyị na-enye nwa ara ga-aṅụ.

Nri ji

Nri ji na ofe nsala

Ebe foto si, Foodace/Instagram

Nkọwa foto, Ike na-agwụ nwaanyị na-enye nwa ara ọsịisọ, ya mere ha kwesiri ina-eri ụtara ji na ofe enweghị mmanụ

Florence Uchendu kwukwara na ike na-agwụ nwaanyị na-enye nwa ara ọsịisọ, ya mere o jiri de si na ọ dị mkpa ka nwaanyị na-enye nwa ara na-erikwa ụtara, tụmadị ji asụrụ asụ.

O kwuru na nke a ga-enye nwaanyị a ikikere o ji eleta nwa ya.

Kedụ maka ụmụ nwaanyị nwere ọrịa shụga?

Nwaanyị na-enye nwa ara

Ebe foto si, Getty Images

Florence Uchendu kọwara na ụmụ nwaanyị nwere ọria shuga ga na-eri ihe etu o si eri ya na mbụ.

O kwuru sị " o nwereike iji unere na-achaghi acha sie mmiri akụ ma ewpu ji".

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: