Pretty Mike: Ihe mere m jiri buru ụmụnwaanyị di ime ga n'agbamakwụkwọ Williams Uchemba

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Skip Instagram post, 1
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 1

Na mkparịtaụka Pretty Mike na BBC Igbo, Pretty Mike sị na o bu ihe ọma n'obi wee buru ụmụnwaanyị ndị ahụ di ime ga n'agbamakwụkwọ Williams Uchemba.

Ọ sị na o mere ya ka o nye ụmụnwaanyị ndị ahụ obi ụtọ.

Pretty Mike kwukwara ọtụtụ ihe maka ndụ ya na mkparịtaụka a.

Pretty Mike na ụmụnwaanyị isii dị ime ọ kpọ bia agbamaakwụkwọ Uchemba Williams

Ebe foto si, PrettyMike/Insta

Nkọwa foto, Pretty Mike ka ọ na-akpa ụmụnwaanyị di ime n'afọ ha n'agbamakwụkwọ Williams Uchemba.

Pretty Mike kpọrọ ụmụnwaanyị isii dị ime bia agbamakwụkọ Williams Uchemba na Brunella Oscar were isi na ha bu nwa ya n'otu n'otu.

Uchemba, nwunye ya na Pretty Mike

Ebe foto si, Uchemba na Pretty Mike Instagram

Ka Pretty Mike na ụmụnwaanyị isii di ime wuchiri, ndị mmadụ wee na-elegharị anya.

Mana o bighi ebe ahụ, ha gara n'ọtụtụ igwe soshial midia, kpụrụ ya n'ọnụ, mere ka o wee wukarịa ndị gbara akwụkwọ.

Pretty Mike na ụmụnwaanyị isii dị ime ọ kpọ bia agbamaakwụkwọ Uchemba Williams

Ebe foto si, Pretty Mike of Lagos Instagram

Nkọwa foto, Pretty Mike na ụmụnwaanyị isii dị ime ọ kpọ bia agbamaakwụkwọ Uchemba Williams
Skip Instagram post, 2
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 2

Onye na-eme ihe nkiri nakwa akpa ọchị a ma ama bụ Uchemba Williams echizuola n'iza di Brunella Oscar.

Ha gbara akwụkwọ nke ụka ụnyaahụ bụ Nọvemba 21, afọ 2020 na Lagos n'isi ụlọụka Dominion City dị na Leeki Phase 1.

Lee ụfọdụ foto si na agbamaakwụkwọ ha pụta:

Williams Uchemba na Brunella nwunye ya

Ebe foto si, Banky W

Williams Uchemba na Brunella nwunye ya

Ebe foto si, MR P

Uchemba na nwunye ya mere agbara nkwụ ha n'izuụka gara aga.

Ụfọdụ ndị ama ama biara agbamakwụkwọ Williams Uchemba

Ebe foto si, Alamy

AY, MR P na ndị ọzọ

Ebe foto si, Ay

I.K na Banky W

Ebe foto si, Banky W INSTAGRAM

Uchemba Williams na nwunye ya Brunella

Ebe foto si, MR P Instagram

Lee Brunella Oscar Nwolisa bụ oriakụ Williams Uchemba na ihe ị na-amaghị maka ya

Brunella Oscar

Ebe foto si, INSTAGRAM/WILLIAMSUCHEMBA

Brunella Oscar bụzị oriaku ọkpaọchị a ma ama aha ya bụ Williams Uchemba.

Foto ebe ha gbara akwụkwọ omenaala wuru ewu ọfụma na soshal midia na ngwụcha izu ụka a n'Alor dị n'Anambra steeti.

Nke a mere dịka Uchemba wepụtachara foto ya na Brunella Oscar sere n'elu soshal midia n'oge gara aga wey na-ekwu na oge eruola o ga-eji lụọ nwaanyị.

Uche Mba/Instagram

Ebe foto si, Uche Mba/Instagram

Uchemba mechara kwuo na agbamaakwụkwọ nke ụka ha ga-eme n'ụbọchị Novemba 21,2020.

Christian Osita Nwolisa

Ebe foto si, Christian Osita Nwolisa

Mana onye ka Brunella Oscar Nwolisa bụzi oriakụ Uchemba bụ?

Brunella Oscar

Ebe foto si, Williams Uchemba

  • Ọ bụ nwa ụkọchukwu Christian Osita Nwolisa ụlọụka akpọrọ Eternal Life Christian Chapel dị na mba England
  • Ọ bụ dọkịta gụrụ akwụkwọ na mba England
  • Ọ gụchara mahadum n'afọ 2018
  • Ọ bụ onye Anambra steeti

Lee ụfọdụ foto si n'agbamakwụkwọ ha:

Uche Mba/Instagram

Ebe foto si, Uche Mba/Instagram

Williams Uchemba

Ebe foto si, AFP

Kedụ Williams Uchemba na Brunella si zute onwe ha?

Williams Uchemba

Ebe foto si, Williams Uchemba/Facebook

Ụlọọrụ Naịja Digest mgbasaozi depụtara na Nwolisa kwuru na ọ hụrụ onyonyo Uchemba na Facebook ma zigara ya ozi n'ọba ozi n'afọ 2016 ya makana ọ nụrụ n'uche ya na ọ hụla di ya.

N'akụkọ ahụ o kwuru na mgbe ọ gwara ndị ọyị ya na ọ hụla di ya na ha che na ọ na-ayị ara.

Brunella kwuru na Uchemba sara ozi ya ma jụọ ebe o si, o mechara gwa ya na o si n'ebe nne na nna ya bụ Nwolisa agaghị ekwe ka ọlụọ nwa ya.

Uche mba, Nwunye ya na AY

Ebe foto si, Ayo Makun (aycomedian) / Instagram

Uche mba, Nwunye ya na AY

Ebe foto si, Ayo Makun (aycomedian) / Instagram

Nkọwa foto, Uche mba, Nwunye ya na AY onye ọkpaọchị n'ụbọchị ha gbarankwụ

Onye bụ di ya bụ Wiliams Uche Mba?

Williams Uchemba

Ebe foto si, Williams Uchemba/Facebook

Williams Uche Mba bụ otu n'ime ndị na-eme ihe ejije ama ama na Naijirịa.

Mba bidoro na soshal Midịa dịka onye na-akpa ọchị ma mechaa banye n'iti egwu nwa mgbe nta

E ji "I dont like what i hate" were mara dịka onye na-akpa ọchị.

Mba bidoro "Project One mIllion" nke ga-enyere ndị mmadu aka ịgụ akwụkwọ, ịmụta aka ọrụ ma ị hụ kwa na ndị mmadụ nwere ebe obibi.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: