"Ee! A sị m Naịjirịa abụghị zoo maka na..." Charley Boy

Charly Boy bụ onye ama ama maka ịchọ ka ndị ọha Naịjirịa nwete ezigbote ọchịchị.
Ka a na-ahazi ntuliaka nke 2019, ọ gwara BBC na ndi ntoroọbịa adịghị eme ihe ha kwesiri ịme.
Ọ sị na ha na-arapụ ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchi na-aghọgbụ ha.
Na nkọwa ya, Charly Boy sị na ọ bụ ndị ntoroọbịa bu gọọmentị.
Onye bụ Charly Boy?
- Ezigbo aha ya bụ Charles Chukwuemeka Oputa, mana aha otutu ya bụ Charley Boy, ọ na-akpọkewa onwe ya 'Odudubarịba'.
- A mụrụ ya na 19 Juun n'afọ1950.
- Ihe ọha jiri mara ya ugbua bụ onye ndụ ngagharịiwe "Our Mumu Don Do"
- Charles Oputa bụ nwa Chukwudiefu Oputa, onye a maama ka ọkaikpe na Naịjirịa.
- Ọ na-ekwu na ikpe mkwumọtọ na-enu ya ọkụ n'obi.
- Ọ bụ odee ma ọgụụ amaama, nwere ụlọọrụ ebe a na-erụpụta egwu dị icheiche. Ọ bụkwa onye ngosipụta na igwe onyoonyo bụrụkwa odee akwụkwọ.
- Ihe e jiri mara ya bụ ụdị ndụ ọ na-ebiri na-eme ka ndị mmadụ ana-ekwutọsị ma na-aja ya. Ọ bụkwa onye e jiri ebumnuche dị aghaa na ndọrọndọrọ ọchịchị mara.
- O nwekwara ihe onyoonyo a marala ka 'The Charly Boy Show'.









