Marriage Certificate: Asambodo agbamakwụkwọ gị ọ bụ adịgboroja?

Ndị gbara akwụkwọ n'ụlọikpe
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Asambodo i ji gbaa akwụkwọ ọ bụ nke ezigbo ka ọ bụ nke adịgboroja?

Ka ị na-eche nke a, Georgina Ehuriah na-arụ na Mịnịstrị na-ahụ maka Naịjirịa niile gwara BBC na ọ bụ naanị ụlọekpere 314 nwere ikike ịgba ndị mmadụ akwụkwọ ma nyekwa asambodo agbamakwụkwọ dị mma.

Ehuriah kwuru na ọ bụrụ na i si ebe enweghi akwụkwọ ikike nke a kpọrọ "license" nweta asambodo agbamakwụkwọ gị, na ị nwere ike ịdaba na nsogbu mgbe oge ruru iketa oke ma di maọbụ nwunye gị nwụọ.

Ọ gwara BBC Pidgin sị "Ụdịrị ihe a na-eme oge ọbụla, ebe ị ga-ahụ di na nwunye chọrọ ịga obodo oyibo, "embassy" agaghị eji asambodo ụlọụka ndị enweghi akwụkwọ ikike nyere gị kpọrọ ihe, makana naanị asambodo Naịjirịa na-enye maka agbamakwụkwọ bụ nke a kpọrọ "Form E".

"Nke a mere ndị ma ihe na-eji aga n'ụlọikpe agbamakwụkwọ bụ "Federal Marriage Registry" gaa gbaa akwụkwọ tupu ha agbaa nke ụlọụka, makana ofufe bụ ihe ndị Naịjirịa jiri biri.

Ehuriah na-arụ ọrụ dịka odeakwụkwọ pụrụiche na mịnịstrị ahụ kwuru sị na ị nwere ike ịga na websaịtị mịnịstrị ha ịchọpụta ma ụlọụka gị enwekwara akwụkwọ ikike.

O kwukwara na ị ga-aganwu na websaịtị ahụ tinye akwụkwọ maka inweta asambodo agbamakwụkwọ.

Mwakpo ndị Uweojii Saụt Afrịka wakporo onye Naịjiria

Gọọmentị Naịjirịa edegarala ndị uweojii Saụt Afrịka akwụkwọ maka mwakpo a wakporo Tayo Faniran n'izu a.

Tayo na onwe ya mechara kelee gọọmentị Naịjirịa maka ịgbatara ya ọsọ enyemaka.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

Cheta na Tayo nọchiburu anya Naịjirịa na Big Brother Africa wepụtara ihe nkiri gosiri oge ndị uweojii mba ahụ tiri ya ihe ma tọdo ya n'olu.

Na mba ofesi,

Idemmiri n'India

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Akụkọ kwuru na ụmụnwaanyị itoolu dị ime so na ndị azọpụtara

Azọpụtala ihe karịrị mmadụ narị asaa tọrọ n'ime ụgbọoloko kemgbe abalị Fraịde n'obodo Mumbai dị na mba India.

Oke mmiri ozuzo butere idemmiri mere ka osimiri tojuo ma na-awufu awufu.

A hụ dimkpa a hụ ogologo imi ya.

Henry Onyekuru na-agbara Super Eagles nke Naịjirịa bọolụ gbara nkwụ nwaanyị ya taa bụ ụbọchị 27 nke ọnwa Julaị na Bini, Edo steeti.

Henry na Esther enyi ya nwaanyị amụọla otu nwa nwoke dị otu afọ na ọma.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ihe ụmụnwaanyị na-ekwu maka 'Senate screening'