Kanayo O. Kanayo: Ihe ise ị maghị maka KOK, onye ghọrọ ọkaiwu ka ọ gbachara afọ 58

Kanayo O. Kanayo

Ebe foto si, KOK

Aha onye ejije Nollywood a ma ama bụ Kanayo Onyekwere Kanayo(KOK) na-akpọtụ akpọtụ ebe nile dịka ọ abụrụla ọkaiwu ụlọikpe Naijiria ka ọ gbachara afọ iri ise na asatọ.

KOK pụtara n'ụlọakwụkwọ ndị ọkaiwu Naijiria ebe a na-azụ ndị gụrụ 'Law' na mahadum tupu ha enwe ike ịpụtakli n'ụlọikpe Naijiria a kpọrọ 'Law School' na Bekee na nsonso a.

N'ozi o wepụtara na soshal midia, Kanayo, onye obi bụ sọ pọlina pọlina kwuru " Onye si na ọ dị mfe, ya gaa ụlọakwụkwọ Iwu' mee ọfụma n'ụle."

Onye bụdị KOK a na-ekwu?

Kanayo, onye ejije aha ya na-ada ụda. Lee ihe ndị i kwesiri ị ma maka ọkpọka a:

  • Tupu Ọ ga-agụọ 'Law' Kanaya gụburu 'Mass Communication' na mahadum "University of Lagos'
  • Ọ banyere n'ime ihe ejije oge ọ pụtara na ejije'Living in Bondage' nke bụ agada mgbachiri ụzọ mere Nollywood ihe ọ bụ taa.
  • Kemgbe o sonyechara n'ihe ejije ahụ, nwa amadị a bụ onye Aboh Mbaise n' Imo steeti esorola mee ihe ejije ruru otu narị (100)
  • O ritela nturuugo dị iche iche gụnyere 'Best Actor of the Year' nke Africa Movie Award(AMAA) nakwa African Magic Viewers Choice Awards.
  • O ji nwaanyị na ụmụ atọ nke otu n'ime ha bụ nwaanyị ha gụrụ ya, Ụlọakụ.
  • O meela ọtụtụ ihe ejije ebe o mere agwa onye otu nzuzo nke mere ụfọdụ ji bido kpọwa ya 'onye ọgwụ ego'.

Kanayo O. Kanayo: Abụghị m onye ọgwụ ego

Aha onyonyo, 'Anaghị m agwọ ọgwụ ọ bụ ihe na-eme n'obodo ka anyị na-egosi' - Kanayo O kanayo

Dịka ndị mmadụ na-ajụ ma na-ekwu na ọ bụ ịgwọ ọgwụ ka e ji mara Kanayo O kanayo na ndị igbo nọ na Nollywood.

Kanayo bidoro were sị "Ihe anyị na-eme na Nollywood bụ ịnyomi ihe na-eme n'obodo ma na-egosi etu obodo dị".

Aha onyonyo, Kanayo O. Kanayo: Ihe m jiri chọọ ịzọ ịga ụlọomeiwu

O kwuru sị "ị na anụ maka ndị mmadụ na-efu izuụka ọbụla, anọkata a chọwa ha achọwa ma asịkwa na-eji ha mee ọgwụ ego. Anyị na-eme ihe ejije iji gwa ndị mmadụ ka onye na-eme njem kpachapụ anya".

Kanayao rụtụrụ aka mgbe Ruben Agbati dere edemede maka ihe dị omimi n'Aso rock were sị " Ihe anyị na-agwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị n'ihe ejije anyị bụ ka ha wepụ aka enwe n'ofe; kedu ihe onye bịara ị rụrụ obodo ọrụ ji ịgwọ ọgwụ eme?".

O kwukwara na ọtụtụ ndị Naijirịa na-eji ihe egwuregwu mmadụ kacha eme ọfụma n'ihe ejije aba onye ahụ aha.

Maka kepukepu na ndị Igbo na-agwọ karị ọgwụ

kanayo O Kanayo

Ebe foto si, kanayo.o.kanayo/Instagram

Kanayo kwuru sị na onye ọbụla sị na ndị igbo na-agwọkarị ọgwụ bụ onye iberibe. Ọ sịkwa na onye ahụ amaghị ebe mmiri bidoro mawa ya.

Igbo bụ ndị na-agba mbọ, nanị ọgwụ ndị Igbo na-agwọ bụ ịgbasị mbọ ike.

Kama o kwukwara na ya asịghị na-enweghị ndị na-agwọ ọgwụ n'ihi na e nwee ọkụ na ọchịchịrị ka a dị kwa.

Kanayo kọwara sị " Anyị anaghị eme ihe ejije ndị Igbo, anyị na-egosi ihe na-eme n'ụwa na-emetụịta mmadụ niile".

Akụkọ ndị ga-amasị gị: