Imo state covid war: Etu ndị ụlọomeiwu 13 si bute coronavirus n’Imo Steeti

Ọfọ ụlọomeiwu

Ebe foto si, Twitter/Nass

    • Onye dere ya, Chioma Obianinwa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist, Igbo

Okammụta Maurice Iwu bụ onyeisi ọgbakọ ehibere maka ibuso covid 19 agha n'Imo steeti ekwuola na mmadụ iri atọ butere coronavirus n'ụlọomeiwu steeti ahụ edopụla onwe ha iche.

O kwuru na ndị butere ọrịa a gụnyere ụfọdụ ndị ụlọomeiwu nakwa ndị ọzọ na-arụ ebe ahụ.

Maurice Iwu kwuru na onyeisi ụlọomeiwu ahụ bụ onye ji echiche amamihe ya kwuo ka agbachie ebe ahụ ruo mgbe e hichara ya ọfụma ma gba ya ọgwụ na-egbu nje.

Gee ihe Iwu kwuru n'uju ebe a:

Aha onyonyo, Etu ndị omeiwu Imo steeti 13 si bute coronavirus- Maurice Iwu

Kedụ ka ha si bute ọrịa a?

Ọkammụta Maurice Iwu kwuru na o nwereike ịbụ site n'aka ndị bu nje a a kpọrọ "Super spreaders."

N'okwu ya, "Super spreaders" bụ ndị bu ọrịa ahụ ma ha amaghị na ha bu ya wee na-akpagharị.

O kwuru na ọ bụrụ na gị na ha nọkọta n'ime ebe na-enweghi mpio ikuku si abata, ha nwereike ibunye mmadụ abụọ maọbụ atọ ọrịa ahụ.

Kedụ ka e si chọpụta ha?

Iwu kwuru na ọ bụ otu onye n'ime ha kpesara otu na-ahụ maka imegide Covid-19 na steeti ahụ, na o nwere ka ahụ si eme ya. Nke a mere ka a sị ya ga nyocha ahụ ya maka Covid-19.

Mgbe ọ gara wee chọpụta na o bu nje Covid-19, Iwu kwuru na nwoke ahụ ji aka ya dopu onwe ya na bee ya ebe a malitere ịgwa ndị ya na ha nọkọtarala na nso nso ka ha ga mee nyocha.

A chọpụtara Covid-19 n'ahụ mmadụ iri na abụọ ọzọ mere nyocha ahụ nke meziri ha iri na atọ buterela ọrịa ahụ.

Iwu kwuru na a ga-emekwa nyocha iji chọpụta ndị ọzọ ha na ndị a nwere mmekọ.

O kwuru na etu ọ dị ugbua, onweghi onye ọbụla n'ime ha a chọpụtara nje n'ahụ ha ọhụrụ a, o jituru na njọ.

Etu coronavirus ji gbuo nwaanyị mụrụ ụmụejima n'Imo Steetị

Ụmụ ejima

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Idemmiri a achụpụla ndị mmadụ na be ha na steeti kariri anọ na Naịjirịa

Nwaanyị butere coronavirus n'Imo steeti anwụọla ka ọ mụchara ụmụ ejima ya.

Maurice Iwu bụ onyeisioche otu na-ahụ maka ibuagha megide coronavirus n'Imo Steeti gwara BBC Igbo nke a na mkparịtaụka ha nwere n'ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa Juun.

Iwu si na ya bụ ọnwụ wutere ha makana ha e nwechala aṅụrị na nwaanyị ahụ mụpụtara ụmụ ejima ya n'agbanyeghị na ọ bu nje Covid-19.

O kwuru na e nweekwala ọtụtụ mmadụ butere ọrịa Covid-19 na steeti ahụ gbakerela.

Ọ ga-akwara n'ihu kwuo na Imo steeti enyochala mmadụ ruru narị asatọ dịka nyocha ka na-aga n'ihu gbua.

Iwu kwuru na steeti ahụ ka na-agwa ndị mmadụ tụmadị ndị na-aga ahịa ka ha kpachapụ anya.

Ka ha na-eso ntuziaka niile otu World Health Organisation nyere gbasara mmadụ ichekwa onwe ya maka ibute nje Covid-19.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: