Eton College arịọla Onyeama mgbaghara maka ịkpasị ya oke agbụrụ

Dillibe Onyeama

Ebe foto si, Dillibe Onyeama

Nkọwa foto, Dillibe Onyeama bụ onyeisi ojii mbụ gụchara akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ Eton

Onyeisi ụlọakwụkwọ Eton gwara BBC na ihere mere ya maka oke a kpasịrị onyeisi ojii mbụ gụchara akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ mba Briten a.

Nwafọ Naịjirịa na-ede akwụkwọ bụ Dilibe Onyeama nwetere asambodo 'First School Leaving' n'ụlọakwụkwọ Eton n'afọ 1969.

O dere akwụkwọ maka ịkpaoke a kpasịrị ya n'ụlọakwụkwọ ahụ nke e mechara mmachie ya ịbịa.

Onyeisi ụlọakwụkwọ bụ Simon Henderson sị " Anyị gbalitela n'ogogo kamgbe ahụ"

Mana o kwenyere na "ihe ndị fọdụrụ a ga-eme"

Ịdọ aka na ntị:Akụkọ nwere mkpụrụokwu ịkpa oke agbụrụ.

A ma ụlọakwụkwọ Eton ama n'ịzụpụta ndị nwere agba na mba Briten gụnyere, praịm mịnịsta Boris Johnson, onye bụ praịm minista mba Briten nke ugboro iri abụọ, Achịbishọp nke Canterburry Justin Welby, Diuku nke Cambridge nakwa Diuku nke Sussex.

Getty
Eton College: Key facts

  • King Henry VI founded it in 1440 to provide free education to 70 poor boys

  • Now charges annual fee of more than £40,000 ($50,000)

  • Enrolmentstands at 1,320

  • Aidoffered to some; 90 paid no fees at all in 2018/19

  • Black pupilstotal about 7%, Asians 8% and those of mixed ethnicity 5%

  • Alumniinclude royals, celebrities and politicians

Source: Eton College & BBC
Presentational white space

Onyeisi ụlọakwụkwọ a sị na ọ ga-akpọ Onyeama ka o zute ya ka o nwee ike rịọ ya n'ihu n'ihu "iji doo ya anya na a ga-anabata ya mgbe ọbụla ọ bịara".

Kedụ ihe Onyeama Kwuru?

Onyeama gwara BBC na arịrịọ ahụ adịghị mkpa na ọ gaghị agbanwe echiche o nwere n'ebe ụlọakwụkwọ Eton nọ, nke bụ nke ọma n'ime ihe niile.

DILLIBE ONYEAMA

Ebe foto si, DILLIBE ONYEAMA

Nkọwa foto, E debara aha Dilibe Onyeama ịgụ akwụkwọ n'Eton mgbe a mụrụ ya
  • Ọ gwara BBC na ụmụakwụkwọ ibe ya kwara ya emu n'ụbọchị ọbụla n'oge ahụ.

A jụrụ ya ajụjụ dịka "Gịnị mere i ji jie ojii?", "Ikpuru ole dị gị na ntụtụ isi?" na "Nne gị ọ na-eyi ọkpụkpụ n'imi ya?"

Ebubo ịghọ aghụghọ

Mgbe Onyeama mere nke ọjọọ n'agụmaakwụkwọ maọbụ mee nke ọma n'egwuregwu, ụmụakwụkwọ asị na maka agbụrụ ya.

Mgbe o mere ezigbo nke ọma n'agụmaakwụkwọ, ọ gbagwojuru ụlọakwụkwọ niile anya.

"Gwa m Onyeama, kedụ etu i si mee ya?" Ajụjụ a bụ ihe a jụrụ m kwa mgbe kwa mgbe, "o dere n'akwụkwọ ya. "'Ị ghọrọ aghụghọ?"'

Dịka ọ gụchara akwụkwọ, o dere ihe ndị a ọ hụrụ n'akwụkwọ ma n'afọ 1972 ọ natara akwụkwọ ozi ka ọ bịakwala ụlọakwụkwọ Eton ọzọ.

Arịrịọ onyeisi ụlọakwụkwọ a na-abịa dịka ọtụtụ mmadụ na-arịọ mgbaghara maka ihe banyere ire ohu na ịkpa oke agbụrụ.

Ihe kpalitere arịrịọ ndị a bụ ngagharịiwe a na-eme ugbua maka ịkpa oke agbụrụ a kpọrọ "Black Lives Matter'.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: