Coronavirus Test: Ihe a ga-eme iji wulite nyocha maka coronavirus n'ala Igbo

Onye a na-enyocha maka coronavirus

Ebe foto si, Getty Images

Ụnyahụ bụ ụbọchị asatọ nke ọnwa June ka onyeisi Nigeria Centre For Disease Control bụ Chikwe Ihekweazu kwuru na o nweghị ka ndị bi n'ala Igbo ghara inwe mgbalite ọnụọgụgụ ndị bu coronavirus maọbụrụ na-eme nyocha zuruoke.

O kwuru na nke a bụ maka na ndị Igbo bụ ndị na-emekarị njem.

Mana gịnị na-akpata emeghị nnyocha zuruoke maka covid-19 n'ọwụwa anyanwu?

Dkta Mcginger Ibeneme bụ , onyeisi 'Isolation Centre, Nnamdi Azikiwe Teaching Hospital, Nnewi, kwuru na o kwetaran'ihe onyeisi NCDC kwuru.

O kwuru na ọtụtụ ndị na-akpọ ụlọọrụ NCDC na-agwa ha na ha na-ahụ ihe na-egosi na ha ebutela ọrịa ahụ, mana ụfọdụ oge ha kpọọ ụlọọrụ NCDC nke steeti o nweghị onye ga-atụpụrụ ha ọnụ.

"A naghị agadị eme ha nnyocha."

O kwuru na steeti dịka Ebonyi na-enyocha mmadụ ruru 100 kwa ụbọchị makana ha nwere ebe nyocha na steeti.

Ihe a ga-eme iji wulite nnyocha maka covid-19 na mpaghara wụwa Anyanwu

Mcginger kwuru na:

  • Ọ bụ ọrụ gọọmenti iwepụta kemikal eji enyocha sampụlụ ndị mmadụ ewekọtara.
  • O kwuru na gọọmenti kwesiri igbado anya n'iwekọta sampụlụ ndị mmadụ achọpụtara bu ihe ngosi covid-19.
  • O kwuru na irụtakwu ụlọ nnyocha nke a kpọrọ 'Lab' na steeti ọbụla dị na mpaghara ọwụwa anyanwu.
  • O kwuru na ọ dị mma ka gọọmenti etiti zụọ ndị ọrụ ahụike nọcha na steeti ndị ahụ ka ha nweike imeli nyocha maka covid ọfụma.

Mbọ niile anyị gbara ịnụta n'ọnụ ndị kọmịshọna ahụike steeti ndị dị na mpaghara ọwụwa anyanwu kpụrụ n'ala makana ha azaghị ekwenti ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: