South East: Ndị gọvanọ ji ndị ọrụ bekee ụgwọ na mpaghara ọwụwanyanwụ

- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist Igbo
Gọọmentị iji ndị ọrụ bekee ụgwọọnwa na Naịjirịa abụrụla akụkọ a na-anụ mgbe ọbụla ọkachasị n'ogogo steeti.
Nke mere na ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eji zi ya achụnta vootu ma oge ntuliaka ọbụla ruo.
N'ime akụkọ, anyị ga-atụle ịkwụ ụgwọọnwa si kwụrụ na steeti ise dị na mpaghaghara ọwụwanyanwụ.
Abia Steeti

Ebe foto si, Facebook/Okezie Ikpeazu
Na Abia Steeti ụfọdụ ndị ọrụ bekee gwara BBC Igbo na gọọmentị gọvanọ Okezie Ikpeazu ejighi ha ụgwọọnwa.
Onye nke na-arụ n'otu Mịnịstrị nọ na 'State Secretariat' sị na a kwụọla ha ụgwọ n'ozuzu rute n'ọnwa Eprelu 2020 na oge eji.
Na oge eji akwụ ha ụgwọ na-abụkarị n'ụbọchị iri abụọ na asatọ n'ọnwa ọbụla na a malitekwara ịgwụ ha ụgwọ opekatampe puku naịra iri atọ n'ọnwa Jenụwarị afọ a.
Mana onye nke na-arụ n'ụlọọrụ mgbasaozi gọọmentị nwe sị na a naghị akwụzu ha ụgwọ ọnwa ka ọfọdụzie ego mgbakwụnye na-eso ya.
Ebe onye nkuzi na Steeti ahụ sị na gọọmentị ji ndị nkuzi ụgwọọnwa site na Jenụwari rute na Ọktoba afọ 2019.
Na ọ bụ n'ọnwa Nọvemba 2019 ka ha malitere riwe ụgwọọnwa rute na ọnwa Febụwarị 2020 na ha eribeghi nke ọnwa Maachị.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na enweghi ego mgbakwụnye maọbụ ụgwọ opekatampe a na-akwụ ndị nkuzi n'Abia Steeti.
Otu onye ọrụ ahụike sị na e ji ha ụgwọ ọnwa iri na anọ, na ọ ka bụ n'ọnwa Eprelụ 2020 ka a kwụrụ ha ụgwọ ọnwa Febụwarị 2019.
BBC Igbo kpọtụrụ odeakwụkwọ gọọmentị Abia Steeti bụ Onyebuchi Ememanka, ọ sị na gọọmentị ejighi ndị ọrụ mịnịstrị ụgwọ.
Kama na ọ bụ ụfọdụ ngalaba 'parastatals' dịka ahụike, ndị nkuzi bụ ndị e ji ụgwọ bụkwa nke ha na-agba mbọ ịkwụchapụ.
Ọ sị na gọvanọ Ikpeazu nwere atụmatụ ime nke a mana nsogbu ọrịa coronavirus emetụtala ya.
Ememanka kwere nkwa na oge na-adịghị anya na gọọmentị ga-akwụcha ụgwọ ndị a.
Anambra Steeti

Ebe foto si, GovernorObianoFacebook
N'Anambra steeti, otu nwoke na-arụ na mịnịstrị na-ahụ maka ikpe sị na gọọmentị gọvanọ Willie Obiano na-akwụ ndị ọrụ bekee ụgwọ mgbe o kwesịrị.
Ọ sị na ọ na-akwụkarị ha ụgwọ malite n'ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa ọbụla ma ndị nkuzi ma ndị ọrụ bekee ọzọ.
O kwuru na akwụọla ha ụgwọ rute n'ọnwa Eprelụ nke afọ 2020, na nke a mere ụfọdụ ndị ọrụ bekee ụfọdụ ji akpọ ya 'Alert Governor'.
N'otu aka ahụ kọmishịọna mgbasaozi bụ Don Adenuba gwara BBC Igbo na o nweghi onye ọrụ bekee ọbụla e ji ụgwọ n'Anambra Steeti.
Ọ sị na gọọmentị ha kwụrụ ụgwọ n'ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa Eprelụ afọ 2020.
Ebonyi Steeti

Ebe foto si, EBONYI GOVERNMENT
Otu onye na-arụ na mahadum Ebonyi Steeti gwara BBC Igbo na gọvanọ Dave Umahi ejighi ha ụgwọ ọnwa ọbụla.
Na ọ kwụrụ ha ụgwọ ọnwa Eprelụ n'ime izuụka mbụ a banyere n'ọnwa ahụ.
O kwuru na ọ bụ etu ka ọ dị n'ebe ndị ọrụ bekee niile n'Ebonyi Steeti nọ.
Mana ọ sị na nsogbu ha nwere bụ na ọ naghị ebulie ha n'ọkwa ọrụ ma oge ya ruo. Na kamgbe gọvanọ Umahi banyere n'ọchịchị na ọ na-aghị ebuli ndị ọrụ n'ọkwa.
Kọmishịọna mgbasaozi n'Ebonyi Steeti bụ Uchenna Orji gwara BBC Igbo na gọọmentị ha ejighi ndị ọrụ ụgwọ kamgbe afọ 2015 rute ugbua.
Ọ sị na ha kwụrụ ndị ọrụ ụgwọ ọnwa Eprelụ n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Eprelụ iji nyere ha aka maka ọrịa coronavirus.
N'ajụjụ ebulighi ndị ọrụ n'ọkwa, ọ sị na ha na-ebuli ndị ọrụ n'ọkwa maọbụrụ na onye ahụ tozuoke site n'ọzụzụ na ole gọọmentị na-enye ha.
Orji sị anaghị anọgide bulie mmadụ n'ọkwa mgbe ohere na-adịghị maọbụ mgbe onye ahụ na-etozughi etozu.
Enugwu Steeti

Ebe foto si, Enugu State Government
Otu nwaanyị na-arụ na mịnịstrị na-ahụ maka njem n'Enugwu Steeti mere ka BBC Igbo mata na gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi ejighi ndị ọrụ bekee ụgwọ.
Ọ sị na ọ na-akwụ ha ụgwọ n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa ọbụla, na ọ malitere ịkwụ ha ụgwọ opekatampe n'ọnwa Jenụwarị afọ a.
O kwuru na ọ na-akwụ ha ụgwọ n'ozuzu oke ma na-agbakwụnye ya nke ọnwa a kpọrọ 13th month na ngwụcha afọ.
Mana otu onye ọzọ sị na gọvanọ Ugwuanyị na-aghị akwụzu ha ego ole o kwesịrị ịkwụ ha.
Kọmishịọna mgbasaozi n'Enugwu steetị bụ Chidi Aroh sị na ha gọvanọ Ugwuanyị ejighi ndị ọrụ bekee ụgwọ ọbụla
Ọ sị ha na-akwụ ndị ọrụ ụgwọ kwa ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa ọbụla ma kwụọ kwa ya n'uju, tinyekwara ụgwọ opekatampe ọhụrụ.
Imo Steeti

Ebe foto si, HE_HopeUzodinma/Facebook
Otu nwaanyị ọrụ bekee n'Imo Steetị sị na gọọmentị Hope Uzodinma ji ndị ọrụ bekee ụgwọọnwa ole na ole.
Ọ sị na ngalaba ọrụ ya bụ 'parastatals' mgbasaozi na kamgbe Jenụwarị gọvanọ Uzodinma banyere ọchịchị na ọ kwụbeghi ụgwọ ọbụla.
Mana ọ sị na ụfọdụ ndị ọrụ mịnịstrị anatala ebe ụfọdụ ndị anatabeghi, na nke a kwụrụ akwụ anaghị ezu ezu.
O kwuru na iri ụgwọ ọnwa n'Imo Steeti enweghi usoro, ụfọdụ rie ndị ọzọ agbara ọnụ.
Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ odeakwụkwọ mgbasaozi gọvanọ Uzodinma bụ ọ sị ka anyị kpọghachị ka o tinye ọnụ n'okwu ahụ.
Oge anyị mechara kpọhachị ya, ọ zaghị ekwentị ya mana anyị ka na-agba mbọ inwete ha.
Akụkọ ga-amasị gị:













