Anambra steeti ga-enyocha ndị ji ya ụgwọ
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:
Ipob amapụtakwala ọzọ wegharịa udo nke ohaneze ndi Igbo na ndị gọvanọ na-achị mpaghara ọwụwa anyanwụ nwere.

Ebe foto si, Getty Images
Ha kwuru na ọ bụ maka na ha enweghi ike ịkwụsị mmachi a machiri Ipob dịka otu na-eyi egwu.
Naịjirịa
Anambara steeti chịkwa ọkụ eso ndị chọrọ ịzọ ọchịchị na steeti ahụ, ha achọghị ndị anaghị atụ ụtụ isi cha cha.

Ebe foto si, GovernorObianoFacebook
Steeti ahụ ekwuola na onye ọbụla chọrọ ịma akwụkwọ n'akụkụ ebe ọbụla iji chụ nta vootu ga-akwụ ụtụ so ya.
Ebe ọzọ na Naịjirịa
Ndị ụlọomeiwu ga-enwe nzụkọ ụbọchị Tuzde n'izu na-abịa maka bọjetị a chọrọ ịgbakwunye na nke 2018.

Ebe foto si, @NGRSenate
Osote onyeisi ụlọ omeiwu nta bụ Yusuff Lasun kwuru nke a ụnyaahụ ka ndị otu ha nọ na pati APC mesịrị ọgbakọ nke otu PDP kwukwara na ha ga-esonye.
Akụkọ mba ofesi
Nọt kọrịya abarala Amerịka mba na ha ka na-enye ha ntaramahụhụ maka ngwọagha nuklia ha.

Ebe foto si, Getty Images
Ha kwuru na ha agaghị akwụsị ime ngwọagha ahụ ma ha jiri ụdị aka ahụ nke ha kwuru na ndị na-eme mkparịtaụka gbasara ya anaghị eso ebumnobi Donald Trump.
N'egwuregwu,
N'egwuregwu, ndị n'ọchị ndị na akwa dịka e mechiri ohere ịzụrụ ndị ọgba bọọlụ n'asọmpi Premia Lig.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Mana ndị ntorobịa ji ọnụ na-eche ya bụ asọmpi ga-amalite taa nke otu egwu bọọlụ Man United na Leicester City ga-ebido.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:






























