Umahi vs Fulani herdsmen : Ndi Ugwu asaala Govanọ Umahi ebubo iwakpo ụmụnwaanyị Ebonyi

Dave Umahi

Ebe foto si, EBONYI GOVERNMENT

Ndi ndu ndị Ugwu bi n'Ebonyi ekwuola na ha na ndị Ebonyi na-ebi ka otu ezinaụlọ.

Okwu a na-apụta dịka Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi tiri mkpu maka mwakpo na mmetọ ndị Fulani ọchịehi na-emetọ ụmụnwaanyị steeti ahụ ma nye iwu ka ndị a na-arụ aka pụọ n'obodo ahụ.

Ihe butere iwu ahụ bu mwakpo onye ọchịehi wakporo otu nwaanyi n'ike n'ụlọ di ya n'Isu dị n'okpuru ọchịchị Ọnịcha na steeti ahụ.

Ọnụ na-ekwuchitara Govamentị Ebonyi Steeti bu Emanuel Uzor gwara ndị BBC na omume a jọgburu udele ma sigbuo nkapi kọwara na dịka omenala ndị Isu si we dindị ọchịehi ka akwapụ n'obodo ha ka ha nwee ike ikpụ arụ maka igbochi ọdachi, e meghị otu ahụ mmadụ ga-ebido nwụwa n'obodo ahụ.

Ndị Fulani na-achị ehi

Ebe foto si, Getty Images

Ọ rụtụrụ aka na e wezụga ihe a mere, na ndị ọchịehi na ndị ọrụubi n'Ebonyị steeti na ebikọrita n'udo.

Mgbe BBC gbara onyeisi ndị Miyetti Allah n'Ọwuwa Anyanwụ bụ Alhaji Gidado Sidiki ajuju maka iwu gọvano nyere ka ndi ọchiehi a na-arụ aka n'ebubo ịwakpo ụmụnwaanyị puo n' Izzu na Isu dị n'okpuru ochichi Ọnịcha, ọ gwara BBC na e kpeziela nsogbu ahụ izu abụọ gara aga oge e nwere ọgbakọ ndị ihe ahụ metụtara.

Gidado Sikkidi

Ebe foto si, Gidado Sikkidi

N'okwu gbasara kepukepu na ndị Fulani na-apị mbazụ ịwakpo ala Igbo , Sikkidi kwuru n'akụkọ ahụ bụ "akụkọ ụgha."

"O nweghị mgbe otu Miyetti Allah jiri kwuo ụdị okwu a."

" Anyị na ndị gọvanọ na ndị Ọwụwa-Anyanwụ dị n'ezi mma."

"Nke a bụghị iji kwuo na e nweghị ebe ndị e nwere nghọtahie mana na ime nghotahie ndị a, e nwere ndozi nke wetara udo."

N'otu olu ahu, Alhaji Isa Beko bụ onye isi ndị Ugwu na mpaghara Afikpo kwuru na ndị be ha na ndị Ebonyị na-ebi n'udo.

Ọ gara n'ihu kwuo na udo dị n'etiti ndi ọchiehi na ndị Ebonyi adịwala tupu alụọ Agha.

Akụkọ ga-amasị: