Enyinnaya Abaribe: Ihe Ndigbo chọrọ bụ ka e mee anyị ka e mere ibe anyị
BBC Igbo gbara Enyinnaya Abaribe ajụjụọnụ maka ọnọdụ Ndigbo na Naịjirịa, o kwuru ọtụtụ ihe miri emi maka ọnọdụ Ndigbo.
Ọ na-ewute ya na gọọmentị jụrụ ịkpọ ndị Boko Haram "Terrorists" ma machie Ipob n'ọnweghị ihe ha mere.
Ọ sị na ọ dịghị mfe ime ka obodo Naịjirịa bụrụ nke ndị Alakụba.
Ọ sị na ya agaghị agba ama ihe ndị pati ya bụ n'obi ganye na ha ezukọọ maka ịhọpụta onye ndu ụlọomeiwu ukwu.
Ndị mere akụkọ a: Chimamaka Ihenacho, Nnamdi Kelechi Agbanelo

