Abaribe ha a ga-akwụ ụlọikpe N100m?

Ebe foto si, BBC/ElliotUkoh/@realFFK
Akụkọ na-eru anyị ntị site n'ụlọikpe ukwu di n'Abuja na-akọwa na ọkaikpe Binta Nyako enyela iwu ka ego Sịnetọ Eyinnaya Abaribe na mmadụ abụọ ọzọ jiri gbara Nnamdi Kanu aka ebe baa n'akpa ụlọikpe.
Ọkaikpe Nyako nyere iwu a iji megharị usoro oji nye Nnamdi Kanu n'aka Abaribe na mmadụ abụọ ọzọ n'ọnwa Eprelụ nke 2017.
Mgbe ahụ, Abaribe, Tochukwu Uchendu na Immauel Shalom ji akwụkwọ akụnaụba ha nara Maazị Kanu n'aka ụlọikpe.
Ugbua, Ọkaikpe Nyako sị ka ha kwụnye nde narị naira (100 million) n'ụlọakụ ụlọikpe.
BBC gbara otu onye metụtara Abaribe ajụjụ ọnụ maka mkpebi a, o were sị na onweghi ihe ngbagwojuanya dị na ya maka na ikpe ka na-aga n'ihu.
"Anyị aghaghị itinye ọnụ n'okwu a karịa ikwu na ikpe ka na-aga n'ihu. Ọ bụ ubọchị 28 nke Mach 2019 ka a ga-alaghachi ụlọikpe maka ya a."
Ọkaikpe Nyako kwuru na ọbụghị Abaribe na ndị ọzọ a ka ọ na-ekpe ikpe.
"Ihe m chọrọ bụ ka ha kpọpụtara m Nnamdi Kanu," Nyako kwuru mgbe ọ kpere ikpe taa.
Iwu ya bụ na Abaribe na mmadụ abụọ a nwere ọnwa abụọ iji kwunye ego a.
Cheta na ebidoro ịchọ Kanu ka ndi agha Naịjirịa na ụfọdụ ndị na-akwado ya kwakọrọ isi na be ya n'afọ 2017.
Ndị Ipob, bu otu Kanu nọ n'isi ha, kwuru na mmadụ 28 nwụru mgbe ndị agha wakporo be ya. Ndị agha kwuru na nke a abụghi eziokwu.
Kanu n'onwe ya sị na ọ bụ egwu na ndi agha ga egbu ya mere ojiri gbaa ọsọ.
Ọ sị na ya nọ Izrel ugbua, ma kwukwa na ya chọrọ ịlọta bịa zara ọnụ n'aka Binta Nyako, "ma ọ ọbụru na mba ụwa ga-ekwe nkwa na ikpe m ga akwu ọtọ".











