Ezekwesili: Aga m akpọpụta Naịjirịa n'ụbịam

Ezekwesịlị

Ebe foto si, @obyezeks

Nkọwa foto, Ezekwesili kwuru na ọ ga-ewepụ ụmụ Naịjirịa ruru nde 80 n'ụbịam

Oby Ezekwesili kwuputere etu ọ ga-esi mee ka ụmụ Naịjirịa ruru nde 80 pụọ n'ụbịam n'ọgbakọ ya ndị otu pati ya na ndị ntaakụkọ nwere na nso nso a.

Ezekwesili kwuru na ụmụ Naịjirịa na-abanye n'ime ụbịam kwa nkeji ruru isii.

O kwuru na ya kwesiri ike n'obodo Naịjirịa na nkwa niile o nwere, "ọ bụ ya mere m ji na-azọ oche onyeisiala."

N'okwu ya,"Anyị nwere ngọzị ala na-emepụta nri ọfụma, azụmahịa kachasị na mba Afịrika, ọnatarachi, anyị kachasị n'akụnaụba n'Afrịka niile.

"Ihe nkiri kachasị n'ụwa niile makana anyị bụ ndị nwere ọnatarachi pụrụ iche. Naịjirịa bụ obodo dị ukwu."

Ezekwesili

Ebe foto si, @obyezeks

Nkọwa foto, Ezekwesili sị na ọ ga-agbanwe ọchịchị #APCPDP

"Enwere m ezigbo ebumnobi maka Naịjirịa ga na-agara onye ọbụla ofụma na abụghị sọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ụfọdụ ma naanị onwe ha."

"Achọrọ m iweta Naịjirịa ga-abara onye ọbụla uru."

"Ana m atụanya na ndị mmadụ agaghị enye anyị udo maọbụrụ na anyị mezụghị nkwa niile anyị kwere."

Ezekwesili kwuru na ọ bụghị naanị ka ọ gbanwee ọchịchị #APCPDP ka o ji pụta ịzọ ọchịchị onyeisiala, mana ọ bụ mmepụta ihe ọma ga-eme ka Naịjirịa bụrụ ezigbo obodo ugbua nakwa ọdịnihu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị :