Imo State: Nwuchi Uzodinma abụghị ndọrọndọrọ ọchịchị - Obono-Obla

Hope Uzodinma ji aha APC azọ ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti na ntuliaka 2019

Ebe foto si, Hope Uzodinma/Facebook

Nkọwa foto, Hope Uzodinma ji aha APC azọ ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti na ntuliaka 2019

Onyeisi ndị ọrụ pụrụiche n'iweghachị akụnaụba ọha bụ Okoi Obono-Obla ekwuola na ha nwụchiri Hope Uzodimma makana oteela achụwara ya maka mmerụaka o mere.

Obla kwuru na ọ bụghị maka na ọ bụrụla onye ahọpụtara ịzọ oche gọvanọ n'Imo steeti dịka ndị mmadụ sị eche.

O kwuru na ya ndị otu ya nwetere kepukepu na Uzodimma na-aga njem wee jee nwuchie ya n'ọdọ ụgbọelu dị n'Abuja.

Obla kwuru na o nweghị ebe ọ bụla iwu kwuru na ị gaghị anwụchinwu onye ọ bụla aka ya adịghị ọcha mgbe maọbụ ebe ọbụla ọ nọ.

Cheta na ndị ọrụ pụrụiche n'iweghachị akụnaụba ọha kwuru na ha nwụchiri Hope Uzodinma n'abalị iri na otu ọnwa Nọvemba afọ 2018 n'ọdọụgbọelu dị n'Abuja.

Onyeisioche ndị ọrụ a bụ Okoi Obono-Obla n'ozi o zigara onye ntaakụkọ Punch kwuru na a nwụchiri Uzodinma n'ihi arụghị ọrụ ngo ọnụ ego ya dị nde dọla iri na abụọ nke ụlọọrụ ya natara ndị Nigerian Ports Authority nke bụ maka igu ọwa mmiri na Calabar.

N'otu aka ahụ BBC Igbo kpọrọ Hope Uzodinma na onye ndụmọdụ ya n'ekwentị mana o nweghi onye n'ime ha zara ekwentị ha.

BBC Igbo Kpọrọ onyeisioche APC n'Imo Steeti bụ Dan Nwafor o kwuru na ọ nụbeghi maka akụkọ mwụchi ahụ ebe odeakwụkwọ mgbasaozi ha bụ FCC jones kwuru na nke a bụ eziokwu.

Jones kwukwara na APC anaghị akwado mpụ na nrụrụaka na ọ dị mma ka Uzodinma ga zara ọnụ ya n'aka ndị ọrụ nyocha.

Ọ gara n'ihu kwuo na aka gọvanọ Rochas adịghị na mwuchi a nwụchiri Hope Uzodinma.

Aha onyonyo, Imo state: Madumere bụ nwa m-Okorocha

Onyeisioche a kwuru na Uzodinma na-agbanarị mwụchi a kamgbe otu afọ gara aga ma rue elekere asatọ nke abalị ụnyaahụ mgbe ha nwụchiri ya.

N'okwu ya "N'ihe dịka nkeji iri abụọ gafee elekere asatọ nke abalịa, ndị ọrụ onyeisiala n'iweghachị akụnaụba ọha nwụchiri Hope Uzodinma ji aha APC azọkwa gọvanọ n'Imo Steeti n'ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe dị n'Abuja dịka o so ụgbọelu Air Peace akara P47324 bata si Legọs.

"Ụlọọrụ a na-enyocha ebubo mpụ megide Sịnetọ Uzodinma nke si n'ọdịda ụlọọrụ ya ịrụ ọrụ ngo ego dị nde dọla iri na abụọ maka igu ọwa mmiri na Calabar."

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: