Ihe Zaiah aha nwa ọhụrụ Banky W na Adesua Etomi pụtara

Adesua na Banky W

Ebe foto si, BANKY W AND ADESUA INSTAGRAM

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ọbịbịa nwa ọhụrụ Zaiah nke Adesua Etomi Wellington na Bankole Wellington AKA Banky W baby na-enye ọtụtụ mmadụ nọ n'elu soshal midia oke ọṅụ.

Ha akpọpụtara ọmụmụ nwa ha ka izu ụka anọ gafechara ma kwuo na aha ya bụ Zaiah.

Mana ọtụtụ mmadụ na-achọ ịmata ihe aha nwa ọhụrụ ha bụ Zaiah pụtara.

Gịnị bụ Zaiah?

Ndị mmadụ depụtara n'ọba ozi ụlọ ọrụ akpọrọ names.org ebe ha na-eche na aha ahụ si. Pasenti mmadụ 53 kwuru na aha bụ nke ndị Hebrew, pasenti 28 kwuru Arabic ebe pasenti 19 kwuru na ọ bụ aha ndị bekee(English).

Otu onye si Uganda kwuru na aha Zaiah pụtara 'Chukwu bụ onye nzọpụta".

Onye ọzọ si Maryland dị na mba US kwuru na ahụ si na Isaiah nke akwụkwo nsọ nke pụtara 'Chukwu bụ onye nzọpụta'.

Onye ọzọ si Virginia na mba US kwuru na Zaiah pụtara onyinye Chukwu mabụrụ aha ndị Hebrew.

Onye ọzọ si Ireland kwuru na Zaiah pụtara chi mara mma.

Mana otu nyocha e mere na mbụ na-ekwu na aha ahụ bụ nke ama ama na mba ebe ndị Arab nakwa nwoke maọbụ nwaanyị nwerike iza ya.

Cheta na Banky Wellington bụ otiegwu ama ama na Naịjirịa na nwunye ya Adesua na-eme ihe nkiri depụtara n'akara instagram ha na ha amụọla nwa nwoke.

Otiegwu Wellington ama ama depụtara nke a na Instagram ya na mọnde.

Adesua

Ebe foto si, @BankyWellington

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ha lụrụ dị na nwunye n'afọ 2017.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu n'elu soshal midia

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Skip X post, 3

End of X post, 3

Skip X post, 4

End of X post, 4

Akụkọ na-abịa.

Banky W ọ ga-azọtanwu oche ụlọomeiwu nta?

Banky W

Ebe foto si, Instagram/bankywellington

Olubankole Wellington bụ otiegwu eji "Banky W" mara, ekwuola na ọ chọrọ ịzọ oche n'ụlọomeiwu nta.

Banky W kwuputere nke a n'elu soshal midia ya, kwuru na ọ chọrọ ịnọchite anya ndị nọ n'okpuru ọchịchị-obodo Eti Osa dị na Legọs steeti.

O nweta oche a, ọ ga-abụ onye na-akpa ndị mmadụ obi aṅụrị mbụ ga-enweta ya n'ime oge ọhụrụ ọhụrụ a.

Dịka foto dị n'akara Instagram ya si kwuo, ọ na-azọ ọchịchị n'okpuru pati "Modern Political Party (MDP)".

Site n'ihe o dere n'elu Instagram ya, o kwuru na ebe e kwuru na ndị ntorobịa enweghị ego ịzọ ọchịchị na ihe ndị ọzọ e kwuru na ha agaghị emenwu, na ha ga-agba mbọ ime ihe ndị ahụ.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

O kwukwara na ọ ga-akara ya mma na ọ nwara daa, karịa na ọ nwaghị.

Akara ntụ-ntụ

Ndị na-eme obi aṅụrị banyere ndọrọndọrọ ọchịchị

  • Desmond Elliot - Onye na-eme ihe nkiri Nollywood. Ọ zọtara oche ịnọchite anya ndị Surulere n'ụlọomeiwu Legọs steeti.
  • Kenneth Okonkwo - Onye na-eme ihe nkiri na Nollywood. Ọ zọtaghị oche APC gaara enye ya ohere iso zọọ ọkwa gọvanọ Enugwu steeti.
  • Kanayo O Kanayo - Onye na-eme ihe nkiri na Nollywood. Ọ na-azọ oche ịnọchite anya ndị Ezinihitte Mbaịse n'ụlọomeiwu nta n'okpuru APGA na 2019.
  • Kate Henshaw - Onye na-eme ihe nkiri na Nollywood. Ọ zọtaghị oche ndị PDP gaara eme ka ọ nọchite anya ndị Calabar Munical/Odukpani na 2014.
  • Yul Edochie - Onye na-eme ihe nkiri na Nollywood. Ọ zọtaghị oche gọvanọ Anambara steeti n'okpuru pati DPC na 2017. Ọ pụtakwara iso zọọ ọchịchị onyeisiala n'okpuru APGA, mana o mechara jiri aka ya sị na ọ chọghịzị ịzọ ọchịchị.
  • Abolore Akande - Otiegwu eji 9ice mara. Ọ zọtaghị oche ụlọomeiwu nta nke ndị Ogbomosho North/Ogbomosho South/Orire na 2014.
  • Bob-Manuel Udokwu - Onye na-eme ihe nkiri. o zọtaghị oche ịnọchite anya Idemili North n'ụlọomeiwu Anambara steeti na 2014.
Akara ntụ-ntụ

Kedụ ihe ị che? Ọ ga-azọtanwu oche a?

Akụkọ ga-amasị gị: