Beans: Ụmụ Naịjiria a ga-agbara nri a ọsọ?

Ebe foto si, @matsecooks
Nafdac na-agwa ndị mmadụ ka ha ghara ịzụta agwa ha hụrụ sniper eji chekwa ya n'ahụ ya.
Ụlọọrụ Nafdac bụ - National Agency for Food and Drug Administration and Control- na Bekee, kwuru na ọ bụ eziokwu na kemịkal eji rụọ ya bụ sniper bụ Dichlorvos, bụ nke e ji egbu arịrị mana ndị ọrụ ugbo kwesịrị iji amamihe nke ha natara dibia bekee wee na-eji ya egbu ụmụ arịrị na-ata ihe akọrọ n'ubi.
Nafdac kwuru na ọ bụrụ na ndị ọrụ ugbo emeghị ya etu ahụ, ya bụ kemịkal nwereike ibute ọrịa anya, akụrụ maọbụ mebie ebe mmadụ si eku ume.
Ha kwukwara na onye ọbụla riri nri kemịkal a mebiri, ga-ebute ọrịa dịka ikpu ishi, afọ ọsịsa nke ọjọọ, ọrịa akpụ, ịkwụsị ịmegharị ahụ, ịgbọ agbọ, ọrịa akwụkwụ maọbụ ọnwụ.

Ebe foto si, @matsecooks
Nafdac kwuru na ụlọọrụ ha na-azụ ndị ọrụ ha ga-akọwara ndị ọrụ ugbo na ndị na-ere mkpụrụ nri, ihe ọjọọ nri a na-etinyeteghị ọgwụ eji echekwa ya ọfụma na-ebute.

Ebe foto si, @matsecooks
Ha dọkwara aka na ntị ka ndị mmadụ gbaara mkpụrụ nri ọbụla ha hụrụ ọgwụ 'sniper' e ji chekwa ya n'ahụ ya ọsọ.
N'ọnụ ha, "erila maọbụ zụta ya."
Lee ihe ị ga-eme ka ị wee gbaara ọdachi ọgwụ eji echekwa mkpụrụ nri ọsọ:
- Gwa NAFDAC ma ị hụ ebe ọbula a na-eji sniper na-awụnye na mkpụrụ nri.
- Saa mkpụrụ nri ọbụla ị na-eri ugboro ugboro tupu ị rie ya.
- Chekwa ndị be gị ka ha ghara iri nri ọbụla eji 'sniper' mebie ebe a na-echekwa ya.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:









