Nafdac laghachinụ n'ọdọ ụgbọ mmiri - Osinbajo

Ebe foto si, BBC
Ngalaba na-ahụ maka ihe gbasara ọgwụ na nri akpọrọ Nafdac ekwuola na osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo enyela iwu ka ha laghachi na ọdọ ụgbọmmiri ọzigbo.
Iwu a biara ka o tebeghi aka onyeisi Nafdac bụ Mojisola Adeyeye boro ọṅuṅu ọgwụ ike dị n'etiti ndị ntoroọbia na ntụbata ụfọdụ ihe ndị amachiri n'iwu.
Nafdac kwuru na mkpebi a ga-enyeaka ibelata ntụbata ogwuike na ihe ndị ọzọ na-adịghị ahụ mma na Naịjirịa.
N'ọnụ ha,"Nafdac natara akwụkwọ osote onyeisiala weputara na Mee 16."
Adeyeye kwuru na n'oge adịghị anya ọtụtụ ndị Naịjirịa anwụọla maka ọgwụ ike na nri na adịghị ahụ mma.
Ọ kwuru na ọgwụike dịka Codeine,Tramadol, na pentazocine egbuola ọtụtụ ndị mmadụ.

Ebe foto si, Getty Images
N'ọnụ ya,ọnwụ ndị a mere maka e wepụrụ Nafdac na ọdọ ụgbọ mmiri kemgbe 2011.
Adeleke kwuru na ọ bụkwa maka ihe nyocha ndị BBC mere nke gosipụtara nnukwu ọhọm dị n'ọgwụ akpọrọ Codeine wetara uche Nafdac n'ịlaghachị n'ọdọ ụgbọ mmiri.
O kwuru na Nafdac ga-akwụsị mbụbata ọgwụike n'ọdọ ụgbọ mmiri.









