Gini mere Germany ji chọọ ịkpọghachị ndị Naịjirịa 30,000

Ebe foto si, Getty Images
Mba Germany na-akwado ịkpọghachite umu Naịjirịa 30,000 na-enweghị akwụkwo nyere ha ikike ịnọ na obodo ahụ.
Onye na-ahu maka ihe gbasara mba ofesi na gọọmentị Naịjirịa bụ Geoffrey Onyeama kwuru nkea mgbe ya na onye ndụmọdụ onyesiala mba Germany bụ Jan Hecker zukọrọ n'Abuja.
Onyeama na-akọwa na onwere nhazi ndị Germany na-eme nke ga-eme ka ahazie ndị a ga-akpọlata ngangwa.
Onyeama kọwara n'ime afọ abụọ gara aga umu Naịjirịa 30,000 kwesiri ịlọta, mana ọ bu sọsọ 200 ka a kpọlatala.
Ka nke a na-eme, BBC Igbo gara otu nwaafọ NaịjiRịa bi na Germany akpọrọ Obinna Chinweokwu ajụjụ maka ihe ọhụrụ na mba ahụ.
Maazị Chinweokwu gwara anyị na ya na-agụ akwụkwọ na Mahadụm na Germany, ebe ọ na-achọ ị nweta akwụkwọ ọkachamara nke akpọrọ PHD na asụsu Bekee.
Ọ sị na ọ bụ ndị si ụzọ mmịri bata Germany ka ihe a kachasi metụta.
Gere ya ndị ebe a:










