Mmadụ 136 esịla Libya laghachịte n'ụtụtụ a

Ebe foto si, Getty Images
Agba ọzọ ndi Naịjiria tọrọ na Mba Libya anatala Pọtakọt na Rivers steeti.
Ndị nke a bụ agba nke ise ga lọta n'afọ a.
Ngalaba n'ahụ maka ihe mberede nke a na-akpọ NEMA sị na eji ụgbọelu Medview were bunata ha n'ụtụtụ ebe elekere 1:10.
Onye n'ekwuchite ọnụ ndị NEMA bụ Sanni Datti gwara BBC n'elu ekwe ntị na ndị ahụ ka n'edenye aha ha ma na nara kwa ọgwụgwọ.
Ndenye aha nke a ga-enye aka ịmata ọnụ ọgụgụ ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị na ụmụaka n'ime mmadụ narị iri atọ n'isii natara.
Akụkọ ka n'abịa.





