Minimum wage: Buhari, ọ bụ gịnị ji nkịta ọnwụ? - NLC

Ndị ọrụ NLC

Ebe foto si, AFP

Otu na-ahụ maka ihe gbasara ndị ọrụ Naịjirịa ekwuola na ha achọghị ma ma onyeisiala Naịjirịa akpọpụtara egole ọhụrụ ụgwọ opekatampe a ga-akwụ ya maọbụ na ha akpọpụtaghị.

Odee NLC bụ Peter Ozo Eson gwara BBC na ha chọrọ ka gọọmentị mere ha ihe niile 'Tripartite Committee' kwekọrịtara gbasara ụgwọ ọrụ opekatampe ma nye ya ụloomeiwu ka ha kpebi ya.

Eson kwuru na ihe kachasị mkpa bụ na onyeisiala kpokọbara otu kwekọrịtara ka akwọ ndị ọrụ ụgwọ opekatampe ruru N30,000.

O kwuru na ọ bụ ụgwọ naira 66,000 ka ha na-ekwu ka akwọ ha mana ha mechara were ntamụ nabata ụgwọ naira 30,000 na-erughị ihe ọbụla.

N'ọnụ ya, "Anyị agaghị a nabata ihe ọ bụla na bụghị ihe otu a ekpokọbara kwuru."

Cheta na onye ndụmọdụ gbasara mgbaza ozi ụlọ ọrụ onyeisala Naịjirịa bụ Femi Adesina kwuburu na o nweghị ego ole ọ bụla onyeisiala Naijirịa k[pọpụtara mgbe ewetara ya mpụtara otu ekpokọbara ị leba anya

ihe gbasara ụgwọ opekata mpe.

Akụkọ ndị ga-amasị: