NLC sị na ha anabataghị ụgwọ ọnwa opekatampe puku naira iri abụọ na anọ

Ebe foto si, Getty Images
otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa na-akọwa na ha achọghị puku naira iri abụọ dịka opekatampe ụgwọ ọnwa ndị ọrụ na Naịjirịa.
Minista na-ahu maka ọrụ bụ Chris Ngige bụ onye tupuru azụ na Wenesde bụ ubọchi nke iri nke ọnwa Ọktoba 2018 sị na gọọmentị kwụrụ na ya ga enye ndị ọrụ gọọmentị etiti puku naira iri abụo na anọ, ebe ndị steeti ga-eri puku naira iri abụọ.
Mkpebi a bịara ka ndị ọrụ mechara arụkwaghịm nke ha sị ha ji dọọ gọọmentị aka na ntị.
Nasir Kabir, bụ onye ode akwụkwọ Nigerian Labour Congress (NLC), gwara BBC na ha na gọọmenti nwere mkparịta ụka maka ụgwọ ọnwa opekatampe, mana na ha ekwekọrịtabeghị.
Ọ sị na aha ego a gọọmentị na-akpọ bu ihe egwuregwu.
O kwukwara na ha agaghi ịnabata ego ole ahụ, makana ha gwara gọọmenti ebumnuche ha.
Kabir kwukwara na ọbụrụ na gọọmentị emezughi ihe ha chọrọ, ha ga alagachi na-abụbụ ọrụ.
Kabir sị, "Gọọmentị kwesiri ịma na bụrụ na enweghị onye ọrụ, enweghị gọọmentị, nke mere ndi ọrụ jiri dịrị gọọmentị nkpa."
Mazi Kabir sị na ego ole ha na gọọmenti kpara bụ puku naria iri atọ, bụ nke gọmentị ekwetabeghị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:











