Akụkọ kachasị na mgbede: Ndị IS gburu ndị agha Naịjirịa asaa - Ndị agha
Akụkọ dị mkpa taa
Mwakpo ndi Islamic State mere ndi agha Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Ndị oyi egwu akpọrọ Islamic State nke Bekee ekwuola na ha gburu ndị agha Naịjirịa ruru iri atọ na otu ma nwuchie mmadụ isi na mwakpo ha mere na obodo Kangarwa dị na Borno.
Okwu pụtara na ozi ndị IS zipụrụ ụnyaahụ.
Ndị agha Naịjirịa kwuburu na ha na ndi omekome a kwara isi nwanne ụnyaahụ na Kangarwa na Arege, mana ha ekwughi maka ndị ometụtara.
Mana taa, ndị agha Naịjirịa dekwara na twitter na ọ bụ ndị otu asaa nwụrụ ka iri na isi merụrụ ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ndị agha kwụkwara na ha nọ na usoro ime ka ndị nwe ndị a nwụrụ mata ihe mere ndị be ha nakw inye ndị merụrụ ahụ ọgwụgwo.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Gọọmentị ekwerela ịkwụ ndị ọrụ N24,000

Ebe foto si, @LabourMinNG
Minister na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige ekwuola na agbanyeghị na gọọmentị etiti kpebiri ịkwụ ndị ọrụ ha opekatampe ụgwọ ọnwa puku naira iri abụo na anọ, nke steeti, puku naira iri abụọ nke, Ngalaba na-ahu maka ndi ọrụ bụ NLC chọrọ iri atọ.
Ọ si na akụkọ na ha ekwerela ịkwụ puku iri atọ abụghị eziokwu
Ihe Pope Francis kwuru maka ite ime

Ebe foto si, AFP
Onyeisi ndị ụka Katọlik bụ Pope Francis ekwuola na ite ime dịka ịkwụ mmadụ ụgwọ ka ogbuoru gị mmadụ.
Okwu Francis a bụ nke kachasi sịe ike kemgbe o bidoro tinyenwe ọnụ n'ihe gbasara ite nwa.
Onye nchikọta ndị otu bọọlụ Libya agbaala arụkwaghịm

Ebe foto si, AFP
Onye nchikọta ndị asọmpị bọọlụ mba Libya akwakọrọla lawa n'ihu egwuregwu bọọlụ mba ahụ na nke Naịjirịa ga-agba maka ima onye ga-etozu oke iko mba Afrika nke afọ na abịa
Adel Amrouche bụ onye mba Belgium kwuru na ọ bụ mgbawa obi ọnọdụ ọrụ ya mere ya jiri kwakọrọ nawa
Gee Nkeji nke mgbede a:
Lee ihe nkiri nke taa
INEC emapụla APC na Zamfara iso mee ntuliaka 2019

Ebe foto si, BBC/Getty Images
Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjịria a kpọrọ Inec amachiela APC na Zamfara Steeti ịwepụta ndị ga-azọ ọchịchị na steeti ahụ.
Inec sị mmiri ribidodoro APC Zamfara maka ịweta akwụkwọ ndị nọchite anya ha.
Buhari chọrọ ịgba mbibi ego ọzọ

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Muhammadu Buhari entinyela akwụkwọ ka ndị ụlọ omeiwu nye ya ikike ibitekwu ego ọzọ na mba ofesi.
Buhari na-arịọ ka ya bite ego karịrị ijeri dọla abụọ nke ọ ga etinye ụfọdụ n'ime n'ọrụ n'afọ a.
Stella Ogonna Okpaleke akwụọla ụdọ na Gana

Ebe foto si, Getty Images
Nwaanyị Igbo akwuọla ụdọ na Gana dịka e mechichara ahịa ebe ha na-azụ ahịa na mba ahụ.
Otu jikọrọ ndị Naijiria na azụ ahịa na Gana kwuru na Ọrịakụ Stella Ogonna Okpaleke, onye ji ụmụ atọ kwụrụ ụdọ ka emechịchara ọdọahịa ya na mba ahụ.
Ndị ụka asaala Lauretta Onochie

Otu jikọtara ndị ụka Kristi niile bụ CAN azachiele ojeozi onyeisala Buharị na Soshal midia bụ Lauretta Onochie na ebubo o boro onyeisi ha bụ Samson Ayokunle.
CAN kpọrọ Lauretta 'efulefu' maka ibo onyeisi ha ebubo mpụ.
IMF adọọla Naịjirịa aka na ntị

Ebe foto si, Getty Images
IMF adọọla Naịjirịa aka na ntị ka ha ghara ịkpụ ụkwụ n'ala maka ịhazịgharị akụnụba alla anyị dịka ọnụ mmanụ agbị na-arị ugbua.
N'aka ọzọ, Hillary Clinton akpọọla ndị pati democrats n'ụlọomeiwu Amerika ka ha nyocha agwa onyeisiala Donald Trump n'usoro ntuliaka 2016 na mba ahụ.
Ụwa a gbaa Black Stars gharị

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu, ka ọ dị ugbua, Gana amabeghị ka asọmpị ha ndị Sierelionu nwere ụbọchị Tọzde aga enwe isi.
Cheta na FIFA machiri Sierelionu maka gọọmenti ha ịtinye aka na ọchịchị egwu bọlụ mba ahụ.
Gee nkeji nke ebe a
Lee ihe nkiri nke taa















