2019 Elections: 'Ma Buhari ma Atiku abụghị onye nzọpụta Naijiria'

Ebe foto si, Getty Images
O dola ewu na ọkụkọ anya na ntuliaka 2019 maka ọkwa onyeisiala ga-abụ n'etiti onyeisiala Muhammadu Buhari na nke APC na Atiku Abubakar nke PDP.
Atiku meriri na ntuliaka imeụlo PDP mere abalị ole na ole gara aga ebe ọ kpụchapụrụ Bukola Saraki na Aminu Tambuwal na mmadụ asatọ ndị ọzọ zọrọ ọkwa ahụ na Pọthakọt.
Mana ajụjụ a kpụ n'ọnụ bụ kedụ mpụtara ihe mere na ntuliaka imeụlọ PDP ahụ?
Kedụ onye n'ime mmadụ abụọ ndị ahụ ga-aza ekpere ndị Naijiria ka ala dị mma?
Kedu ihe o jiri bụrụ naanị Buhari na Atiku na-ewu ebe ndị ọzọ sokwa n'ọsọ onye ga-abụ onyeisiala?
Mpụtara PDP Convention

Akụkọ kwuru ka ego bekee siri si aka fere aka na ntuliaka imeụlọ PDP.
Ọkacharamara n'okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị ma bụrụ onye nchịkọta otu a kpọrọ 'Human Rights Volunteer Corps' bụ Larry Oguego kwuru na ihe mere na Pọtakọt bụ "Bazaar nke onye wepụta ego karịa buru ihe e rere lawa."
Oguego kwuru na nke na-egosi na otu PDP amụtabeghị ihe n'ihe mere ha oge gara aga nke ha na adịbeghị nkwadobe ịchọ onye ga-eduga Naijiria n'ụwa ọma.
Ọ sịrị: "Ihe obodo anyi chọrọ bụ ka a họpụta onye nwere ebumnobi obodo anyị, onye ga-akwụsị ngarị."
Ma Atiku,ma Buhari agaghị azọpụtali Naijiria

Ebe foto si, Getty Images
Oguego ekwuola na Atiku na Buhari abụghị ndị ga-azọpụta Naijiria n'ihi na ị họrọ otu n'ime ha bụ nnụnụ isi n'ala begoro na mkpu.
" Ma Atiku,ma Buhari enweghị onye ọ dị ka ọ bụ ya ga-eme ka Naijiria dị mma.
"Ihe anyị chọrọ bụ onye nwere akọ, nwe uche, nwe umeala.
"Onye a ga-asị nweta ego ka eke, ọ sị mba ka e were ya rụọ ọrụ. O metu ọgalanya ọ metụ ogbenye.
" Anyị chọrọ ọbara ọhụrụ, onye ga-ahazigharị ọnọdụ obodo anyị."
Ihe mere o jiga-abụ naanị Buhari na Atiku na ntuliaka 2019

Ebe foto si, Twitter
Oguego kwuru na ndị ọbara dị ọkụ dịka Kingsley Moghalu, Donald Duke,Fela Durotoye, Oby Ezekwesili, Sowore agaghị enweli ike ịkwapụli Buhari na Atiku bụ ndị agba ochie n'ọkwa ọchịchị na 2019 n'ihi na ha e jikọghị ọnụ.
"Ọ bụrụ na ha jịkọtara ọnụ wepụta otụ onye ha ga-akwado ka ha ga-eme onwe ha ndị nke atọ.
"N'ihi na ha enweghị ụdị ego e ji azọ ndọrọndọrọ n'ala anyị nke ha na enwe aga-amara nke Atiku maọbụ Buharị nwere."
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:











