PDP Convention: Ihe Atiku Abubakar kwuru maka mmeri ya

Ebe foto si, @atiku
Atiku Abubakar ekwuola na ya anabatala ọnụ ọgụ vootu pụtara na Portharcourt taa ebe o meri dịka onye ga-azọ ọkwa onyeisiala Naijirịa n'okpuru patị PDP.
N'ime ozi nnabata ya, o kelekwara ndị ọzọ sọ n'ịzọ yabụ ọkwa na ntuliaka imeụlọ ahụ.
Naịjirịa ahụọla ọrụ aka APC
Atiku kwukwara na o nwere olilianya na Naijiria ga-anabata otu ndọrọndọrọ PDP mgbe ha ga-ebido ntuliaka 2019 makana ha hụọla ọrụ aka APC.
N'ọnụ okwu ya: "Patị anyị ga-akagbu aha ala anyị Naịjiria n'ime aha ndị mba ogbenye na mbaụwa, ala anyị ga-alaghachị azụ n'ala ọma ọ bụrụ n'oge garaaga".
Sinatị President Bukola Saraki kelere Atiku Abubakar maka mmeri o nwetara na ntuliaka PDP chịkọbara n'Adokie Amasiemaka stadium.
Saraki kwere nkwa na ya na ndị dara ada ibe ya ga adọnyere Atiku ukwu ka ha napụta Buhari na APC ọchịchị.
Atiku Abubakar onye mmeri!
A kpọpụtala Atiku Abubakar dịka onye ga-azọ ọkwa onyeisiala n'aha PDP na ntuliaka Atiku Atiku onye nwetara vootu 1,532 kachasị mmadụ 12 zọrọ ọkwa ahụ.
Ndị na-eso ya bụ Aminu Tambuwal onye nwetara 693 na Bukola Saraki onye nwetara 317.
N'ime ozi o dere na twitter, o kele ndị otu PDP niile maka mmeri a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Atiku na Buhari ga-ama mbe abụọ nke bụ oke na ntuliaka afọ 2019.
Lee ụfọdụ ndị na-azọ ọkwa ọnyeisiala na ntuliaka ahụ dịka ngụkọ na-aga ugbua:
- Jonah Jang 8
- David Mark 35
- Datti Ahmed 5
- Sule Lamido 96
- Tahiru Bafarawa 48
- Dakwanbo 111
- Ahmed Makarfi 74
- Kabiru Turaki 65
- Kwankwanso 158
- Bukola Saraki 317
- AminuTamuwal 693
- Vootu adịghị mma - 68
Nhọchasị akwụkwọ vootu

A gụwala vootu a tụkọtara taa n'ọgbakọ ugwu PDp na-eme n'Abuja kemgbe ụnyaahụ bụ Satọde.
Ịtụ vootu kwụsịrị ka o ji nkeji iri na isi gafee Elekere isii(6.16am) ewere bido ihazi vootu nke onyeisi Kọmịtii ntuliaka ahụ bụ Gọvanọ Ifeanyi Okowa nọ n'isi ya.
Iji mee ka ọgbaaghara ghara ịdị Gọvanọ Okowa ekwuola na ha agaghị ekwu okwu n'igwe e ji ekwu okwu ganye na ha agụchaa ya bụ vootu.
Ndị nnọchiteanya mmadụ 4000 bụ ndị bịara ya bụ ije mana naanị madụ 3274 bụ ndị nwetara ikike sonye tụọ vootu.

Ka ọ dị ugbua, ndị kọmitii na-ahụ maka ntuliaka ka na-ahọchasị akwụkwọ vootu, ebe ọtụtụ ndị nkwado na-agụ egwu na-enwe aṅụrị iji kwadobe maka mmeri onye nke ha.
Mbido ịtụ vootụ
Ndị nnochiteanya (delegates) bidoro kwụwa n'ahịrị n'ụzọ ụtụtụ taa bụ ụka n'ama egwuregwu Adokiye Amasimaka dị na Pọtakọt.

Nke a na-eme dịka mmadụ 12 na-azọ ọchịchị onyeisiala kwuchara ihe ha ga-emere ndị Naịjirịa ma ha nweta ọchịchị.
Goodluck Jonathan kwuru na obi jupụtara ya n'aṅụrị n'ihi na PDP adịla njikere iweghara ọchịchị na 2019.Ike Ekweremmadu jikwa ohere ahụ kwuo na ndị niile na-azọ ọchịchị kwere nkwa ịkwado onye ọbụla pati họpụtara.
Ufọdụ ọnụọgụgụ ndị nnochiteanya tinyere aka n'akwụkwọ gụnyere;
- Abia 106
- Ebonyi 101
- Enugwu 125
- Imo 104
- Rịvas 131
- Edo 79
- FCT 35
- Kaduna 103
- Kano 129
- Katsina 101
- Kogi 93
- Kwara 102
- Bayelsa 74
- Legos 64
- Taraba 93
- Benue 121
- Borno 57
- Nasarawa 62
- Krọs Riva 95
- Niger 83
- Ogun 21
- Delta 141
- Ondo 64
- Osun 88
- Oyo 87
- Yobe 58
- Zamfara 48
'PDP adịla njikere ịnarakwa ọchịchị na 2019'

Onyeisi otu PDP bụ Uche Secondus ekwuola na pati ha adịla njikere ị napụ Buharị na APC ọchịchị na 2019.
Ọ gwara ụmụ Naịjiria ha napụta APC ọchịchị ka o wee diri ha mma.

Ka ọ dị ugbua, steeti isii enweteghị ndị ga-ebinyere ha aka n'akwụkwọ na ọgbakọ ukwu PDP.
Ndị na-achịkọba ya bụ mbinye aka nke Gọvanọ Delta steetị bụ Ifeanyị Okowa nọ n'isi ya ekwuola na ọ bụ steetị ndị ahụ ka a na-eche ka ya bụ mbinye aka malite n'uju.
Steeti ndị ahụ a hụbeghị na ya bụ ogbakọ bụ Imo, FCT, Kano, Kaduna na Yobe.

Anyị ka na-ewetara ụnụ ka o si aga na ntuliaka imeụlọ ndị otu PDP na-eme na Portharcourt ugbua.
Ọ bụ ndebanye aha n'akwụkwọ ka a na-eme ugbua nke akpọrọ "accreditation" n'olu bekee.
Lee foto gosiri ka ime ọgbọ egwuruegwu a dị ugbua:

Akpati a ga-eji mee ntụlkiaka.



Ka ọ dị ugbua, enyebeghị ndị ntaakụkọ ohere ị bata n'ime ebe a na-eme ya bụ "Convention" nke ndị PDP.
Mana onye ntakụkọ BBC nọ ebe ahụ ugbua zitere anyị foto ihe na-eme na mpụta ebe ahụ.


Ndị ọrụ nchekwa dị iche iche kwụ chim n'ala nechekwa ebe ahụ.

Ndị na azọ ọkwa onyeisiala na PDP

Anya niile na-achakwasị Portharcourt, isi obodo Rivers maka ntuliaka imeụlọ nke PDP (convention) ga-eme na steeti ahụ n'ụbọchị isi (taa) n'ime ọnwa Ọktoba.
Ndị na-azọ ọkwa bụ onye chiburu dịka osote onyeisiala Naịjirịa bụ Atiku Abubakar; gọvanọ Sokoto steeti bụ Aminu Tambuwal; gọvanọ Gombe steeti bụ Ibrahim Dankwambo; onyechiburu dịka gọvanọ na Kano steeti bụ, Sinetọ Rabiu Kwankwaso; nakwa onye chiburu dịka gọvanọ gọvanọ Sokoto Steeti bụ Attahiru Bafarawa.
Ndị ọzọ bụ onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ, Sinetọ Bukola Saraki; onye chiburu dịka onyeisi ụlọomeiwu ukwu bu David Mark; Tanimu Turaki (SAN); onye chiburu dịka gọvanọ Plateau steeti bụ, Sinetọ Jona Jang; onye chiburu dịka gọvanọ Kaduna Steeti bụ, Sinetọ Ahmed Makarfi; onye chiburu dịka gọvanọ Jigawa Steeti bụ, Alhaji Sule Lamido na Dr. Datti Baba-Ahmed.
''Anyị dị njikere''
Ndị uweojii na steeti ahụ ekwuola na ha ga-enwe ndị uweojii ruru puku iri na abuọ na nari asatọ dịka ndị nche na ntuliaka imeụlọ a.
Ha kwuru na ndị uweojii a ga-agba mbọ hu na udo dị n'ọgbọ egwuregwu Adokiye Amiesimaka ebe ha ga-ame ntuliaka imeụlọ a nakwa ebe ndị ọzọ.
APC
Otu All Progessives Congress ahọpụtala Muhammadu Buhari dịka onye ga-azọ ọkwa ọchịchị onyeisiala n'okpuru APC.
Ugbua ka PDP ga-egosi maka ha were udi mmadụ ga-ama Buhari aka mgba nke ukwu na ọsọ ntuliaka 2019.










