UBEC: Ụmụakwụkwọ na-anọghị n'ụlọakwụkwọ eruola nde 13.3

Ebe foto si, AFP
Ngalaba na-ahụ maka ikwado agụmakwụkwọ Praịmarị na secọndịrị bụ UBEC ekwuola na ọnụgụgụ ụmụaka Naịjirịa hapụrụ agụmaakwụkwọ esila na nde 10.5 gbagoo nde 13.2.
Onyeisi ngalaba ahụ bụ Hammid Bobboyi kwupụtara nke a n'Abuja n'ụbọchị Tọọsde oge ya na otu mbaụwa na-ahụ maka ụmụaka bụ Unicef zukọtara.
"Afo ole na ole gara aga, nsogbu Boko Haram dagidere Naịjirịa ma mee ka ọtụtụ ụmụaka pụta n'ụlọakwụkwọ ha dị na mpaghara ahụ.
Bobboyi onye kwuru nke a site n'ọnụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ịkpalite mụọ ọha na ụlọrụ UBEC bụ Bello Kaigama sịrị : "Ọ bụrụ na ịgbakọọ ụmụaka ndị gbara ọsọ ndụ na ndị a na-amụ ugbua, ị hụ na ngụkọ ahụike (demographic health survey) nke Unicef mere n'afọ 2015 gosiri na ụmụaka anọghị n'ụlọakwụkwọ eruola nde 13.2."
Ụnicef ndị kwuru na ọtụtụ ụmụaka ndị a nọ na mpaghara ugwu rụtụtụ aka na ha na-agba mbọ ka ha na ndị eze 200 nakwa steeti 19 kparịta ụka etu ha ga-esi gbo ya bụ ọgụ agụghị akwụkwọ.






