A nwụchiela onyenkuzi na-elere nwaakwụkwọ ule

Ndị uweojii dabatara n'ebe a na-ele ule ma jide Benjamin Manirambona ka ọ na-ele ule dịka ọgbaama gbara ya.
Ọ maghị na ndị uweojii yi akwa nkiti juru ụlọakwụkwọ ahụ kemgbe abalị ya na-eche ịnwụchị ya.
Oge ọ hụrụ na o nweghị ebe ọ ga-agbaga, onyeisi Butere Technical College kwetara na ihe aghụghọ ahụ mere.
Mazị Manirambona kọwara na ya na-enyere onye agha nọ ọrụ na mba Sọmalị dịika otu na ndị agha ọkpa ụdo aka ime ule kọmputa ahụ
Ọ kọwara na onye agha ahụ kwere ya nkwa ego ma ọ lọta.
Dịka ọ siri kọwa,nwa akwụkwọ nwere mkpa ezigbo akara iji banye mahadum.

Onye mịnịsta na-ahụ maka agụmakwụkwọ na mba Burundi bụ Janvière Ndirahisha sị, " Ihe niile ị na-ekwu bụ asị,asị, ya mere anyị kpụ gị apụ."
Ndirahisha kwuru na ọ bụghị mbụ Manirambona na-eme ụdị ihe n'ihi na ha nwetara akụkọ ya nke mere o jiri kpọrọ ndị uwe ojii na ndị ntaakụkọ bịa ije ahụ.

Akụkọ ga-amasị gị











