A nwụchiela onyenkuzi na-elere nwaakwụkwọ ule

Benjamin Manirambona
Nkọwa foto, Ndị uwe ojii nwụchiri Manirambona n'ịga ma kpụrụ ya pụọ

Ndị uweojii dabatara n'ebe a na-ele ule ma jide Benjamin Manirambona ka ọ na-ele ule dịka ọgbaama gbara ya.

Ọ maghị na ndị uweojii yi akwa nkiti juru ụlọakwụkwọ ahụ kemgbe abalị ya na-eche ịnwụchị ya.

Oge ọ hụrụ na o nweghị ebe ọ ga-agbaga, onyeisi Butere Technical College kwetara na ihe aghụghọ ahụ mere.

Mazị Manirambona kọwara na ya na-enyere onye agha nọ ọrụ na mba Sọmalị dịika otu na ndị agha ọkpa ụdo aka ime ule kọmputa ahụ

Ọ kọwara na onye agha ahụ kwere ya nkwa ego ma ọ lọta.

Dịka ọ siri kọwa,nwa akwụkwọ nwere mkpa ezigbo akara iji banye mahadum.

Mịnịsta na-ahụ maka agụmakwụkwọ na mba Burundi bụ Janvière Ndirahisha tụrụ Mazị Manirambona mhie ya n'ihu
Nkọwa foto, Benjamin Manirambona (R) Bụ onye mịnịsta na-ahụ maka agụmakwụkwọ na ndị uweojii nwụchiri

Onye mịnịsta na-ahụ maka agụmakwụkwọ na mba Burundi bụ Janvière Ndirahisha sị, " Ihe niile ị na-ekwu bụ asị,asị, ya mere anyị kpụ gị apụ."

Ndirahisha kwuru na ọ bụghị mbụ Manirambona na-eme ụdị ihe n'ihi na ha nwetara akụkọ ya nke mere o jiri kpọrọ ndị uwe ojii na ndị ntaakụkọ bịa ije ahụ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị