Ntuliaka imeụlọ APC ga-abụzi ụbọchị Sepụtemba 30

Ọkọlọtọ otu APC

Ebe foto si, @BolajiAbdullahi/Twitter

Kọmitii ojezi nke etiti otu pati APC agbanwela ụbọchị ntuliaka imeụlọ otu APC kwadoburu ime echi bụ Satọde, abalị 29 nke ọnwa Sepụtemba 2018.

Ntuliaka ahụ ga-abụzị ụbọchị ụka bụ abalị 30, ọnwa Sepụtemba.

Ọkwa dị n'akwụkwọ mgbasaozi nke odeakwụkwọ mgbasaozi APC bụ Yekini Nabena binyere aka na ya ma zitere ndị ntaakụkọ n'ụbọchị Toosde.

Ozi ahụ kwuru na ntuliaka imeụlọ ndị ọzọ ga-adị ka e siri hibebuo ya.

* Oktoba 2, 2018 - Ntuliaka maka ọkwa Sineti * Oktoba 3, 2018 - Ntuliaka maka ụlọomeiwu nta * Oktoba 4, 2018 - Ntuliaka maka ndị ga-aga ụlọomeiwu nke steeti * Oktoba 6, 2018 - Ọgbakọ zuzugbe maka ọkwa onyeisiala

Akụkọ ga-amasị gị: