2019 Election: Economist, HSBC na-akọ ajambene-APC

Ebe foto si, Getty Images
Otu APC kwuru na amụma ụlọọrụ abụọ ndị nke sị mba Briten pụta na-ebu bụ amụma ụgha nke enweghị eziokwu dị ya.
Ngalaba nchọpụta nke ụlọọrụ akụkọ Economist a kpọrọ 'The Economist Intelligence Unit, ' na bekee, kwụrụ na APC agaghị emeri na ntuliaka 2019, ebe HSBC buru amụma na akụnaụba Naijiria ga-akụ afọ n'ala ma ọ bụrụ na onyeisiala Nigeria bụ Muhammadụ Buhari merie na ntuliaka 2019.
N'ozi nke odeakwụkwọ mgbasaozi otu ahụ bụ Yekini Nabena binyere aka, APC gwara ụmụ Naijiria ka ha ghara ịkpọ ozi ahụ si n'aka ụlọọrụ abụọ a okwu dịka ha kwuru na ọ bụ ụdị amụma ụgha a na-amabu nke na anaghị emezu.
"Anyị ga-echeta na a maburu amụma na Naijiria ga-ekposa n'afọ 2015, ebe agburu dị iche iche ga agawara onwe ha.
Nke a bụ afọ anọ ya ha buru amụma ụgha ahụ, kama Naijiria ikposa, ọ na-esiwanye ike dịka onyeisiala Buhari na-agba mbọ ijikọ obodo anyị ọnụ."
Ha gara n'ihu kwuo na ọ na-agba pati ha gharịị ihe mere n'ụlọọrụ abụọ ahụ ahụghị ihe ọma niile ọchịchị APC merela na-ibua agha megide nrụrụaka, ọrụ mmepe na ibụ agha megide iyi-egwu.
APC rụtụrụ aka na ego niile EFCC nwenitara n'aka ndị zuru ego Naijiria, mgbalite ego JAMB nakwa ụlọọrụ na-anata ụtụisi.
Pati ahụ kwuru na kama ịja ọchịchị APC ike maa sonye na mgbasa ozi ka anata ndị buru ego ha ji, na ụlọọrụ abụọ na-akọ nke abụghị ya.








