Achịcha Bekee: Ihe kpatara ọnụ ego ihe eji eme ya ji ria elu

getty images

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị na-ere achịcha na-enwetakarị ezigbo ego na ya

Otu onye n'ime ndị na-emepụta achịcha bụ Patience Akpuru-Egwuwa ekwuola na ihe kpatara ọnụ ego ihe e ji emepụta achịcha ji rịa bụ maka oke ntụkwasị obi ụmụ Naịjirịa nwere n'ihe a na-ebubata Achịcha Bekee: A ga-ebuli ọnụ ego ya?ebubata.

O kwukwara na o tela eji e bugo ọnụ ego ihe eji eme achịcha na Naịjirịa nke kpatara na achịcha bekee dị ọnụ karịa etu ọ dị na mbụ.

Gere ihe o kwuru ebe a n'uju:

Aha onyonyo, Ọnu ego ihe eji eme achịcha na-agabli elu oge ọbụla.

Ọnụ ego achịcha nwere ike ịrị elu n'oge na-adịghị anya dịka otu a kpọrọ "Premium Bread Makers Association of Nigeria" sị kwuo.

Ha kwuru na ntaramahụhụ oke ọnụego ihe e jị emepụta achịcha bekee na-ada n'ahịa na-ewetere ha emetụtala etu ha sị emepụta ya bụ achịcha.

Onyeisi ha bụ Jemide Tosan kwuru na kamgbe afọ atọ, ọnụego ihe e ji emepụta achịcha ji wee riwe elu, e nwebeghị ka ọ si hara n'ọnụ ego ihe a na-ere achịcha ugbua.

O kwuru na ọ bụrụgodu mgbe ọnụ ego mmanụ ụgbọala rịrị elu, "achicha bekee ji persenti 11 wee ria."

Ndị na=-emeputa achịcha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Achịcha bụ otu nri ụmụ Naịjirịa na-erikarị

N'okwu ya, ụfọdụ n'ime anyị na-aga ebịte ego n'ụlọ akụ ka ha wee kwudosie ike na ya bụ azụmahịa mmepụta achịcha nakwa iji wee hụ na ha apụghị n'ahịa.

Tosan kwuru na etu ọ dị ugbua, ụfọdụ ndị otu ha enweghị ihe ha nwere ike ime ma na abụghị ibuli ọnụ ego achịcha bekee nke ga-emetụta ndị onweghị ka ọha ha.

Ndị na-emeputa achịcha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ihe eji emeputa achịcha rịa elu, ọnụ ego achịcha na-arịkarịelu ozigbo

"Anyị na-ekwe nkwa na anyị ga na-enye ụmụ Naịjịrịa achịcha zuru oke ma na-edozi ahụ ọfụma."

Lee ihe osise gosiri ọnụ ego Achicha bekee gbalitere kamgbe afọ atọ.

Ihe osise
Nkọwa foto, Ọnụ ego achicha bekee arịala kamgbe 2015

Akụkọ ndị ga-amasị gị: