#OsunDecides: Buhari ọ gwara ndị dara ntụliaka Osun okwu mgbawaobi?

Buhari,Aregbesola,Oyetola

Ebe foto si, @APCNigeria

Nkọwa foto, Buhari kelere Rauf Aregbsola maka etu o si chia ndị Osun ọfụma
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari e kelela pati ya nakwa Adegboyega Isiaka Oyetola, bụ onye meriri na ntuliaka e mere na Osun state ụbọchi September 27.

O tokwara ndị ọzọ so zọọ ọche gọvnọ na steeti ahụ ma dụọ ha ọdụ ka ndị niile mpụtara ntuliaka a ejughị afọ gaa na ụlọikpe ga mee mkpesa.

N'ozi onyeisiala sị n'ọnụ onye na-ekwuchitere ya kwu bụ Garba Shehu, o kwuru na etu ntuliaka Osun state sị ga ọfụma gosiri na ọchịchị onyekwuo uche ya na-esiwanye ike na Naịjirịa.

Buhari gara n'ihụ too ndị ụlọọrụ INEC maka na ha weliri isi Naịjirịa ma tokwa gọvanọ nke na-apụ na Osun steeti bụ Rauf Aregbesola maka etu o si chi ndị Osun steeti kamgbe afọ asatọ n'ụzọ ziri ezi.

Ihe ndị mmadụ sara ozi na soshal:

@patrickimoh kwuru na ọ bụ ihe ihere na onyeisiala depụtara udiri ozi a.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

@teryima_tsebo kwuru na ihe a gosiri ọchịchị aka ike karia ọchịchị onye kwuo uche ya.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

@godbentechmedia kwuru na ọchịchị Buhari akụzigoro onye ka a ga-esi ghọ aghụghọ na ntuliaka 2019.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Mana e nwere ndị kwenyere na ya bụ ozi

@dolutuyi kwuru na ndị ọjọọ bụ ndị na aghaghị a nabata ozioma a onyeisiala ziri.

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

Aworan Gboyega Oyetola

Ebe foto si, Gboyega Oyetola/Facebook

Nkọwa foto, Oyetola je olori awọn osisẹ ni ọfisi Gomina Aregbesọla.

Ntuliaka e megharịrị n'Osun steeti ụnyaahụ abịala n'isi njedebe, ebe otu na-ahụ maka ntuliaka bụ Independent National Electoral Commission akpọpụtala Gboyega Oyetola dịka onye meriri na ntuliaka ahụ.

Dịka Inec si kpọpụta, Oyetola ji vootu narị anọ n'ọma (482) wee gaa ogbo ya onye PDP bụ Ademola Adeleke.

O nwere nchịkọta vootu dị ọnụọgụgụ 255,505, ebe Adeleke nwere nchịkọta ọnụọgụgụ dị 255, 023.

Oyetola zọrọ ọchịchị ahụ n'okpuru pati APC bụ ndị na-esobu PDP n'azụ na ntuliaka mbụ e mere ụbọchị Satode gara aga abalị 22 Sepụtemba afọ 2018.

Cheta na e megharịrị ntuliaka n'ụfọdụ ebe na steeti ahụ maka na Inec kagburu vootu ebe ndị ahụ.

Mana ọnụọgụgụ vootu ndị a kagburu karịrị ndịiche vootu onye otu pati PDP ji aga onye nke APC.

Akụkọ ga-amasị gị