Osun election: Ihe ndị mmadụ na-ekwu

Dịka ọ kwụ ugbua, ndị Ọshụn amabeghị onye ga-abụ gọvanọ ha n'afo anọ na-abịa, mana echiche ha bụ na ọ ga-abịa na njedebe n'ụbọchị 27 nke ọnwa Septemba, 2018.
Ọ bụ oge ahụ ka ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec sị na a ga-emegharị ntuliaka n'atụmatụ Bekee kpọrọ "Ward' atọ dị n'okpuru ọchịchị atọ na ya bụ steeti.
Cheta na onye rụrụ ọrụ dịka ihe Bekee kpọrọ 'returning officer' na ntuliaka Ọshụn bụ Joseph Adeola Fuwape, kwuru na ntuliaka ahụ ezughi ezu makana ọnụọgụgụ vootu niile a tụrụ na ya bụ ntuliaka gosiri na ihe kewara pati abụọ nọ n'isi erụghị mmadụ ole nwereike ịtụ vootu na 'ward' ndị a akagburu ntuliaka ha.
Ọ pụtara na ndị nwereike ịtụ vootu na 'ward' atọ a dị mmadụ 3498. Ihe onye zọrọ ọchịchị n'okpuru PDP jiri gaa onye nke APC na ntuliaka ahụ bụ mmadụ 353.

Fuwape gbadoro ụkwụ n'iwu obodo mgbe o kwuru na a ga-emegharị ntuliaka n'ebe ndị akpọrọ aha dịka:
N'ọdụ vootu nke 9, akara nke 001 nakwa 004 nke dị n'okpuru ọchịchị Orolu; ebe mmadụ 393 denyere aha n'akwụkwọ e ji ama ndị tozuru iso mee ntuliaka, a kagburu ntuliaka ebe ahụ makana ndị omekome buru akpati vootu gbalaga.
- Na Ward 9, vootu mmadụ 167 denyere aha sokwa na ndị akagburu maka okwu ibu akpati gbalaga.
- N'ọdụ vootu 15, akara nke 010 dị n'okpuru ọchịchị Ife Nọt bụ ebe mmadụ 502 denyere aha ha, akagburu ntuliaka makana igwe e ji eme ntuliaka nwere nsogbu.
- N'ọdụ vootu 16, dị n'okpuru ọchịchị Ife Sawụt, akara abụọ nwere nsogbu, nke metụtara mmadụ 812 na 502 na nhatanha.
- N'otu ọdụ vootu n'Oshogbo bụ isi obodo Ọshụn steeti ebe mmadụ 884 denyere aha, onye na-anakọta vootu boro ebubo na onye nlekọta ọdụ ahụ nke Bekee kpọrọ "presiding officer" jiri vootu atụtara gbafuo.

Ọtụtụ mmadụ na-etinye ọnụ na ya bụ okwu.
N'ụbọchị Septemba 23, onye bụ Minista mgbasaozi bụ Lai Mohammed, gwara BBC na ntuliaka a gosiri ndị otu ya na ha ekwesịghị iji PDP gwuo egwu n'Ọshụn.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na etu e si mee ntuliaka ahụ masịrị ha, agbanyeghi na onwere ebe ha che na Inec riri mperi.
Mana, onye bụ onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki dere na soshal midia na echiche ya bụ na Inec emeghị nke ọma maka mkpebi ha mere banyere ntuliaka a.
O kwukwara na ọdịghị n'aka Inec ịkabi ntuliaka ọbụla, na ọ bụ sọọsọ ụlọikpe nwere ike ime ihe a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mana ọtụtụ mmadụ katọrọ ihe a o kwuru, makana ha sị na ọbụghị mbụ ụdịrị ihe a na-eme, ma kwukwa na usoro ya dị n'iwu Naịjirịa.
Ihe ọkaiwu gwara BBC Igbo
Ike Chijioke bụ onye ọkaiwu kwuru na Inec nupuru isi n'iwu na mkpebi a makana ha ejighị akwụkwọ iwu Naịjirịa mee mkpebi a.

O kwukwara na Inec jiri ntuziaka banyere ntuliaka nke Bekee kpọrọ "electoral guidelines" mee mkpebi a.
N'ọnụ okwu ya: "Ihe Inec kwesiri ime bụ ịchọpụta ihe iwu gbasara Naijirịa kwuru banyere ụdịrị ihe a mere n'Ọshụn.











