Osun 2018: "Vootu gị bụ ike gị, ere na ya"
Otu a na-akpọ 'Watching the Vote - Yiaga Africa' bụ ndị nọ na-eme nyocha na ntuliaka Osun steeti arịọla ndị mmadụ ha ere na vootu ha.
Cheta na ndị uweoji ekwuola na ha nwụchiri ụmụnwoke abụọ bụ ndị echere na ha na-ego votu na ntuliaka ahụ.
Ndị uweojii kwukwara na ha jidere ha ebe ha ji ego karịrị narị puku isii ma bidokwa nyocha.