Ebubo mmaja: Ọ bụ ndị ọkaiwu Naịjirịa mebiri aha ha - Eze

Ndị ọkaiwu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị ọkaiwu na-ekwuchitere ndị ndọrọndọrọ ọnụ ha ụlọikpe

Ndị ọkaiwu n'Anambara steeti ekwuola na ha agaghị ekwe ka ndị uweojii majaa ha ọzọ na steeti ahụ.

Ọkachamara Ilochi Okafor bụ onye ọkaiwu Naịjirịa kwuru nke a ebe ha na anabata afọ ọhụrụ n'ọrụ okaiwu na Naịjirịa.

Okafor kwuru na mmaja eruola ebe ha atụghị anya nke mere ha na-ebo ndị uweojii ebubo na ha na-atọzị maọbụ wakpo ndị ọkaikpe.

Mkparị a sị n'aka ndị ọkaiwu bịa

Mana na nyocha BBC Igbo mere maka ebubo a, otu ọkaiwu bụ onye nkuzi iwu na Mahadum Katsina aha ya bụ Chukwuemeka Eze kwuru na ọ bụ ndị okaiwu butere mkparị a.

Ọ gwara BBC Igbo na ndị okaiwu emetọọla aha ha ebe ụfọdụ n'ime ha na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eme nruru aka.

Asari Dokubo

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mana iwu kwuru na onyeọbula agbanyeghi ebubo dị ya n'isi ga-enwe ọkaiwu nke ya

Eze kwuru: "Ndị uweojii na-ahụ mpu ha na-eme, ya mere enweghị nsọpụrụ n'ahụ ha"

Ha kpuru isi iwu n'ala

Eze kwusirike na ọtụtụ ndị ọkaiwu Naịjirịa so na ndị na-emebi obodo makana ha na-ekpudo iwu isi n'ala.

O kwukwara na ihe a na-eme bụ ihe ịdọ aka na ntị ka ha chegharịa.

"Ọ bụrụ na onweghị onye na-enye ndị ọkaiwu nsọpụrụ, ọ pụtara na okwu igbaso ihe dịka iwu siri kwu nke ha kpọrọ 'rule of law' na Bekee nọ na nsogbu."

Ihe ga-eme n'ihu

Ọkachamara Okafor kwuru na ha na ndị isi ọchịchị ndị uweojii na steeti ahụ ga-enwe nzukọ maka nsogbu a.

Mana Eze kwuru na ọ bụ nanị ikpupu ha n´ụlọikpe ngwa ngwa mgbe ọbụla ha mere udi ihe a ga-ebi okwu a.

Akụkọ ga-amasị gị