India: Idina nwunye maobụ di mmadụ abụghị njọ

Nwoke na nwaanyị

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, N' Indịa, idina nwunye maọbụ di mmadu anọghịzị na iwu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Na Naijiria tụmadị n'ala Igbo ọ bụ arụ ma di maọbụ nwunye "gbaa n'ezi."

Mana akụkọ rutere anyị ntị kwuru na bido taa (Septemba 27, 2018) gawa n'ihu n'obodo India, di maọbụ nwunye mmadụ nwereike ịgba n'ezi.

Ọ bụ ụlọikpe ukwu dị n'India kpebiri ya bụ iwu.

Na mbụ, nwoke maọbụ nwaanyị ọbụla kwasoro onye ọzọ iko emeela njọ.

Gini kpatara ihe a?

Otu onye kpesara na ya bụ iwu adabaghị maka na o megidere nwaanyi na nwoke.

Amaghị onye ọbụla a nwụchirila maka imebi ya bụ iwu.

Nke a mere ya iwu mgbe ochie abụọ e mere mgbe ndị ọcha na-achị India a na-akachapụ n'ọnwa September a.

Ọ nọchikwara iwu nke kwuru na mmekọ nwoke na nwoke na nwaanyị na nwaanyị abụghịzị njọ.

Ihe ndị Igbo na-ekwu maka ya na soshal midia

Ndị akwadoghi ya

Ihe ndị mmadụ sara
Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị Igbo ekweteghị na ya
Ihe a sara

Ndị kwadoro ya

Onye kwenyere

Lee ihe ndị mmadụ kwuru ka BBC Igbo jụrụ ajụjụ a na soshal midia: