Ohaneze: Aka anyị dị ọcha n'ebe Ipob nọ

Nnia Nwodo

Ebe foto si, Ohaneze/Facebook

Nkọwa foto, Nnia Nwodo chọrọ nhazigharị Naijiria na mpaghara na mpaghara nke a kpọrọ 'Restructuring na bekee

Onyeisi Ohaneze bụ Nnia Nwodo ekwuola na aka Ohanaeze adịghị na mmachi gọọmenti etiti machiri Ipob.

Nwodo kwuru nke a dịka otu Ipob gụpụrụ onwe ha na mkparịtaụka ikpe udo n'etiti otu abụọ ahụ.

O kwuru na ihe Ohaneze mere bụ iti mkpu tigara onye ọkaiwu kachasị n'ala Naịjirịa (attorney-general) megide imachi Ipob, ndị enweghị egbe ha bu ha ji achọ ihe ha na-achọ, ebe ndị Miyetti Allah bụ otu jịkọtara ndị ọchiehi ogbu ọchụ na agagharị n'enweghị mmachi ọbụla.

O kwuru na ha kpọkwara oku ka enyocha ma kpụpụ ụlọikpe ndị agha sonyere n'egwu eke emere n'afọ 2017.

Ndị na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra

Ebe foto si, Getty Images

Ọ gara n'ihu kwuo na ihe Ipob na-achọ bụ referandum na ihe Ohaneze na-achọ bụ 'restructuring bụkwa maka nnwereonwe, nke agaghị akwafu ọbara.

Ihe ndị a niile dị n'ozi nke onye enyemaka mgbasaozi Nwodo bụ Emeka Attah binyere aka.

Cheta n'ụbọchị Tọọsde, Ipob gbara abụbụ na nkata udo ha na Ohaneze nwere ,sị na ha chọrọ referandum ebe Ohaneze na ndị gọvanọ ala Igbo chọrọ ka ha nweta osote onyeisiala n'aka PDP na ntuliaka nke 2019.

Akụkọ ga-amasị gị :