Oku ikpeazu maka ịzọpụta ụwa site 'mgbanwe ihu eligwe'

Ebe foto si, Getty Images
Ihe bụ oku ngwucha, ndị ọkammụta kwuru, n'ihe bụ ndụmọdụ kachasiri maka nsogbu nwere ike ịpụta maka ụjọọ ha na-atụ na ụwa na-adịzị ọkụ.
Ozi ha gbasara maka ị hụ na-emere ihe niile a ga-eme ịhụ na ekomọku a na-ekwu okwu ya agafeghị 1.5 degrees C sị na ụwa a ekopula n'ụzọ ọma na-aga 3C.
Ekpomọku ịnọdụ na 1.5C a chọrọ ga-ewe "mgbanwe etu ụwa si ebi ugbua ọsịsọ ọsịsọ".
Ọ ga-ada ezigbote ọnụ - mana ohere a ga-eji mee ya ka dị.
Atụmatụ a pụtara n'azụ ndị ọkamụta mechara nchọputa maka ihe a, nke riri ha afọ atọ. Ka ha mechara nchọpụta a, ha gakwara Sawụt Kọrịa, ebe ha na ndị si ngalaba gọọmentị akpọrọ Intergovernmental Panel on Climate Change (IPCC) sụtụrụ okwu a ọnu tupu ezipu ya bụ ozi.
Akwụkwo a bu ozi a gosiri na a nụrụ ezigbote ọgụ tupu enwe nkwekọrịta maka atụmatụ a.

Ebe foto si, Getty Images

Ụzọ ise a ga-eji ru 1.5
- Mpụta akpọrọ "Global emissions" kwesiri iji pasentị 45 datuo n'afọ 2030
- Ekwesiri iji ụzọ ọhụrụ rụpụta ọkụ latrik ihe ruru pasentị 85 n'afọ 2050.
- A na-atụ anya na Kol kwesiri ịgbadaru ihe yiri efu
- Ihe ruru ala dị nde asaa n'ọnụọgụgụ kwesiri ị dị maka "energy crops" (ya bụ ihe mba Ọstralia ji obere ihe were ka)
- A ga-akwụsị "Global emissions" kpam kpam n'afọ 2050

Ego ole ka ọ ga-eri?
Ọ gaghị eri obere ego.
Akwụkwọ pụtara na nyocha a kwuru na ịbelata okpomọkụ rue 1.5C ga-agụnye "ị tinye ego ruru tarị dọlla 2.4 site n'afọ 2016 rue 2035".
Dọkịta Stephen Cornelius bụ onyeọrụ WWF kwuru na "uru na ọghọm ekweisir ịnyocha dị na ya bụ ihe", ọ sị na ọ ka mma ka-ebelata ya ugbua karịa ị kwụ ụgwọ ịwepụ ya bụ okpomọkụ n'ọdịnịhụ.
Gịnị ga-eme ma anyị gbachi nkịtị?
Ndị na-eme nyocha na-ekwu na ọbụrụ na anyị ewedaghị okpompku na njụoyi n'okpuru 1.5C, ihe dị egwu ga-eme n'ụwa anyị.
Mmiri niile dị n'ụwa nwereike ịrị elu ma anyị kwe ka ọ rue 2C. Nke a ga-eme ka ide mmiri ghara ị metụta ihe ruru mmadụ nde iri.
Ọ ga-emetụtakwa ekpomọkụ na njụoyi osimiri dị ịcheịche ma me kwa ka ọ raa ahụ ị kọ nrị dịka osikapa na ọka.
Kaisa Kosonen bụ onyeọrụ Greenpeace bụ ndị so eme nyocha a kwuru na "Anyị abaala n'oge dị egwu n'ihe gbasara mgbanwe ihu eluigwe,". O kwukwara na osisi ndị ọchie bigoro afọ narị dị ole na ole jizi aka ha anwụ.









