Zamfara primaries: Ọbụghi eziokwu na anyị enweghi ndi ga-azo ọchịchị - APC

Ebe foto si, Getty Images
Pati na-achị Naịjirịa bụ All Progressives Congress (APC) asaala mkpebi ngalaba na-ahazị ntuliaka na Naịjirịa bụ nke akpọrọ Independent National Electoral Commision (Inec) na Bekee mere maka ntuliaka imeụlọ nke ha mere na Zamfara steeti.
Inec kwuburu na APC enweghi ndị ga-anọchịte anya ha na ntuliaka nke 2019 makana ha emeghị ntuliaka imeụlọ tupu ụbọchị asaa nke ọnwa Ọktoba bụ oge Inec sị na nabata aha ndị ga-azọ ọchichị ga-emechi.
N'okwu APC, dị n'akwụkwọ mgbasaozi onyeisi oche ha bụ Adams Oshiomhole binyere aka, mkpebi Inec na ha emeghị ntuliaka imeụlọ n'usoro kwesiri abụghị eziokwu makana ọbụghị ihe mere.
APC sị na ha mere ntuliaka imeụlọ n'ụbọchị isi na asaa nke ọnwa Ọktoba 2019.
Ha kwuru na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ha mere nzukọ na ụlọ ụra akpọrọ City King Hotel dị na Gusau, isi obodo Zamfara steeti, ebe ha nọ mee nkwekọrịta maka ndị ga-azọrọ ha ọchịchị.
APC kwukwara n'usoro Inec wepụtara iji hazie ntuliaka imeụlọ nyere ha ohere inye Inec aha ndi ga-azọ ọchịchị rue ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Ọktoba, "bụ oge ekwesiri iji hazie nsogbu pụtara na ntuliaka imeụlọ niile".
"APC nọ n'ụzọ ihazi nsogbu pụtara n'ime ntuliaka imeụlọ anyị, nke mere o jiri tụọ anyị n'anya na Inec ekweghị ka anyị wepụta aha ndị ga-zọrọ anyị ọchịchị tupu ha eme mkpebi a," akwụkwọ APC a kwuru.
APC gakwara n'ihu rụtụ aka na ha echeghi na otu na-anọghi n'ọchịchị bụ Peoples Democratic Party (PDP) emeghi ntuliaka imeụlọ na Kano, mana Inec edegaghara ha ụdịrị akwụkwọ a.
Cheta na ọgụ na mgba banyere ntuliaka imeụlụ ndị APC mere na Zamfara.
Lee ọgbaghara batara n'ebe APC na-eme ntuliaka imeụlọ na Enugwu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:












