Mmọnwụ sụrụ mmadụ mma na asara ọnụ ya n'aka ndị uweojii

Mmọnwụ ndị Ondo

Ebe foto si, Princess Williams

Nkọwa foto, Mmọnwụ ndị Ondo

Ndị uweojii akparala otu mmọnwụ na onye so ya ha boro ebubo na ọ ha sụgburu otu nwoke dị afọ iri atọ maka okweghị inye ha ego.

Onyeisi ndị uweojii n'Ondo steeti bụ Olugbenga Adeyanju bụ onye gwara ndị ntaakụkọ na ndị otu ha nwụchịkọrọ mmọnwụ a n'onye so ya dị afọ iri asaa na ise.

Onye a asụrụ mma bụ nwa amadị dị afọ iri ato aha ya bụ Femi Makanjuola.

Mmọnwụ

Ebe foto si, iStock

Makanjuola nwụrụ ka ihe mere n'ebe a na-eme emume na Akure, isi obodo Ondo steeti.

Uweojii na Ondo kwuru na ọ bụ nwanne onye mmọnwu mara mma aha ya bụ Seun Makanjuola gbara ama maka ihe a mere na ọlụ ọrụ uweojii na "B" Division, dị n'Akure.

"Anyi nwụchịrị mmọmwụ a aha ya bụ Olu Oluwokere na otu onye aha ya bụ Adaramola Ajuloko, mana ndị ọzọ aha ha bụ Deji Dada, Danjuma na Sunday Adaramola gbwara ọsọ," Adeyanju kwuru, ma tinye na a ga-akpọrọ mmọnwụ a ga ụlọikpe ma ha mecha nchọpụta.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ