Mmechi ahịa Ghana: Nwaanyị Igbo akwụọla ụdọ

Ụdọ
Nkọwa foto, Ịkwụ ụdọ na-arịzị elu n'ihi ihe isiike na nsogbu ndị ọzọ

Otu jikọrọ ndị Naijiria na-azụ ahịa na Gana a kpọrọ National Association of Nigerian Traders (NANTs), Ghana na bekee kwuru na Oriakụ Stella Ogonna Okpaleke, kwụrụ ụdọ ka emechịchara ọdọahịa ya na di na mba ahụ.

Onyeisi otu ahụ bụ Chukwuemeka Nnaji kwupụtara nke a oge otu ahụ gara ịhụ onye ojeozi onyeisiala Buhari n'okwu gbasara ndị ala Naijiria bi mba ọzọ bụ Abike Dabiri-Erewa.

Nnaji kọwara na nwaanyị ahụ ji ụmụ atọ gbara mbibi n'ụlọaku ebe ndị ọchịchị Gana mechiri ọdọahịa ndị o nwere.

"Na ụbọchị Satọde, 22 nke ọnwa Septemba otu onye otu anyị bụ Stella Ọgonna Ọkpaleke, onye ndị ọchịchị Gana kpọchịrị ọdọahịa ya egbuola onwe ya."

"O kwụrụ ụdọ dịka a kpochiri ọdọahịa ya na nke di ya, ebe o nwezighị olileanya na a ga-agbape ya.

"Nwaanyị ahụ bụ onye okpuru ọchịchị Nnewi n'Anambra steeti.

"Ọ gbara mbibi n'ụlọakụ mana anyị amaghị ego ole o ji ha."

Nnaji onye tụrụ arịrị na mkpagbu a na-eme ndị Naijiria bi Gana nakwa ndị na-azụ ahịa na arịọ gọọmenti Muhammadu Buhari ka ha gbatara ha ọsọ ha.

Cheta na mba Gana wepụtara iwu na onye ọbụla na-azụ ahịa ga-akwụ otu nde dọlla n'aka mịnịstri mba ahụ na-ahụ maka azụmahịa ma mechikwa ọdọahịa ọtụtụ ndị na-azụ ahịa, nke metụtara ọtụtụ ụmụ Igbo bi na mba ahụ.

Akụkọ ga-amasị gị: