2019 election: Ohaneze ekpebibeghi onye ha ga-akwado - Nnia Nwodo
Ka ntuliaka 2019 na-abịa nso, onyeisi ngalaba na-ahụ maka ihe metụtara ndi Igbo akpọrọ Ohanaeze Ndigbo bụ Nnia Nwodo ekwuola na otu a ekwubegbị onye ha ga akwado.
Nwodo kwuru nke a mgbe BBC Igbo kpọro ya n'ekwenti maka mkpebi Ohaneze banyere ntuliaka 2019.
O kwuru na agbanyeghị na Ohaneze na ndị otu ọzọ dịka ha na mpaghara Naịjirịa ọzọ nwere nzukọ ebe ha kpebiri na onye ha ga-akwado na ntuliaka na-abịa bu onye kwenyere na ihe Bekee kpọrọ "Restructuring", o rubeghị mgbe a ga-akpo okwu ezigbo aha ya.
Nwodo si na ihe mere nke a bụ na ndị na-azọ ọchịchị onyeisiala Naịjirịa karịrị, nke ụfọdị n'ime ha bụ ụmụafọ Igbo.
"Oge erubeghi mgbe anyị ga-ekwu onye anyị ga-akwado, mgbe oruru, anyi ga-ekwu okwu."
Okwu Nwodo a pụtara n'azụ ụfọdụ ulo ntaakụkọ dere na Ohaneze ga-akwado onye ndọrọndọrọ kwadoro "Restructuring".
Atiku Abubakar, bụ onye na-azọ ọchịchị n'okpuru pati na-anoghi n'ọchịchi bụ Peoples Democratic Party (PDP), kwuru okwu ọfụma maka "Restructuring" a, bu atụmatu o sị na ya kwadoro ọfụma.
Onwekwara ndi na-ekweghi n'ihe Abubakar na-ekwu bụ ihe o ga emenwụ, makana mgbe ọ bụ osote onyeisiala n'ọchịchị Olusegun Obasanjo, ejiji nkwado mmegharịa obodo n'ụdị a mara ya.
Gee Nwodo ntị n'elu:
N'akụkọ yiri ibe ya, ndị otu IPOB kwukwara na he akwadoghi ka onye Igbo pụta ka osote onyeisiala n'okpuru PDP maka ha sị na ihe ha chọrọ bụ nkewa, maọbụ nke Bekee kpọrọ "Referendum", nke nkwereike ibute nkwekọrịta nkewa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:











