Jamb: Ohere adikwara mmadụ 200,000 nwetere nnabata na Mahadum Naịjirịa?

Ebe foto si, Enugu State University facebook
Ngalaba na-ahụ maka ide ule maka ịbanye ụlọakwụkwọ mahadum dị iche iche na Naịjirịa nke a kpọrọ 'Joint Admissions and Matriculation Board'(JAMB) na Bekee ekwuola na ha enyeela ụmụakwụkwọ ruru 200,000 akwụkwọ ikike ịbata na Mahadum dị iche iche na Naịjirịa.
Onyeisi mgbasa ozi JAMB bụ Fabian Benjamin kwuru na ụmụakwụkwọ kariri nde 1.6 bụ ndị dere ule a.
O kwukwara na umụakwụkwọ ha nyere ikike a nwere ruo ụbọchị 16 n'ime ọnwa Oktoba nke afọ ka ha nabata ya bụ ikike.
Ụmụakwụkwọ ọhụrụ 200,000
Mahudum Naịjirịa ha nwere ike ịnabata ụmụakwụkwọ ruru 200,000 n'ime ha ugbua?

Ebe foto si, Getty Images
Cheta na ọtụtụ akụkọ apụtala n'oge gara aga na-ekwu na ọtụtụ mahadum na Naịjirịa enweghị ike ịnabata ọtụtụ ụmụakwụkwọ makana e nweghị ohere na akọrọngwa nkuzi ga-ezu ha ọnụ.
Ọtụtụ oge foto dị iche pụtara na social media na-egosi ebe ọtụtụ ụmụakwụkwọ kụrụ ọtọ mgbe ha na-amụta ihe na klass dị iche iche.
"Ọ sịghị n'aka JAMB"
Mana na nyocha BBC Igbo mere maka akụkọ a, ọtụtụ ụmụakwụkwọ BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ kwuru na JAMB anaghị ezite ọtụtụ ụmụakwụkwọ karịe ọnụọgụgu mahadum ahụ nwere ike ịnabata.
Otu nwaakwụkwọ na-aga Mahadum Legọs steeti na-achọghị ka aha ya pụta n'akụkọ a kwuru na ihe na-ebute nsogbu a bụ na ọtụtụ oge mahadum na-enwe mpaghara mmụta dị iche iche na-anabata ọtụtụ ụmụakwụkwọ ọhụrụ.
N'ọnụ okwu ya: "Mahadum dịka Legọs nwere ọtụtụ mpaghara mmụta a kpọrọ 'Diploma programmes n'bekee.
"Na ngwụcha afọ niile Diploma programmes a na-anabata ọtụtụ ụmụakwụkwọ ọhụrụ."

Ebe foto si, Getty Images
O kwukwara na: "Ị gụkọ ndị sị programmes a n'onụ ọgụgụ sị n'aka JAMB, ọ na-ebute ọtụtụ ụmụakwụkwọ na Mahadum anyị".
Onye ọzọ na-aga Mahadum Portharcourt kwenyere na ihe ọnye nke mbu kwuru.
Ọ gwara BBC Igbo na JAMB mara ihe ha na-eme.
N'ọnụ okwu ya: "Mahadum Portharcort na-eji ohere dị iche iche anabata ụmụakwụkwọ ọhụrụ. Ihe a na-eme ebe a bụ na ha ga-enyeghị ''course'' ọzọ maọbụrụ na nke chọrọ ejuola. Anaghị anabata ụmụakwụkwọ ọhụrụ na department juru ọnụ"
Anyị gbara mbọ inwete National Universities Commision ka ha gwa anyị uche ha gbasara akụkọ a mana ọ nweghị onye buru ekwenti oge anyị kporọ ha maọbụ za ozi anyị zigere ha na email.
Akụkọ ga-amasị gị











