Notorious Crimes: Rev King, Otokoto, Clifford Orji na ndị ọzọ mere mpụ kpọtụrụ akpọtụ na Naijiria n'afọ 80s, 90s, 2000s

- Onye dere ya, UCHE AKOLISA
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
Ihe dị, ihe dịkwa. Mpụ na-eme kwa mgbe mana e nwere mpụ na-ama ala jiji mabụrụ nke a kọrọ ya ntị nụrụ ya agbaka.
Lee ụfọdụ mpụ ndị kpọtụrụ akpọtụ n'agbata afọ 80s, 90s na 2000s na ndị omekataraihedaaụjọ nkata kpudoro maka ime mpụ ndị ahụ wuru ewu:
1. 'Rev King', ụkọchụkwu na-eche ọnwụ maka igbu ọchụ

Ụkọchukwu a ma ama bụ Chukwuemeka Ezeugo a ma ama dịka 'Reverend King' bụ onye na-eche ọnwụ ya kemgbe ọnwa Jenụwarị afọ 2007 bụ oge ụlọikpe mara ya ikpe ọnwụ maka igbu ọchụ.
Tupu abalị 2006 bụ ụbọchi ọdachị dọbara ụkwụ ya n'ụlọmkpọrọ malitere, onye ụkọchukwu ahụ na-achịkọta ụlọụka 'Christian Praying Assembly' dị n'Ajao Estate, Legos bụ egwu e ji.
Nwaamadi ahụ bụ onye Achina dị n'Okpuru Ọchichi Aguata,Anambara steeti nwere ebu, nwee mfụ.
Ụlọụka ya nke na-ewu ewu oge ahụ na-adọta igwe mmadụ gụnyere ndị ọgaranya na ndị ọnụ na-eru n'okwu.
Ị gaa ụlọaka ya oge ọ chị ọgbọ,ihe ị ga-ahụ bụ ndị mmadụ;ụmụokorobịa, ụmụagbọghọbia na ndị okenye na-eku ndụ,ndụ, ebe ama ha na-adị ka ọdọ ụgbọala dara oke ọnụahịa.
Mana akụkọ gbanwere malite n'abalị Julai 22, afọ 2006.
Kedụ ihe butere ụkọchukwu a sị gụrụ 'Psychology' na mahadum 'Nnamdi Azikiwe Univesity' Awka n'ọnọdụ ọ nọ ugbua?
N' ụbọchị ahụ, Ezeugo kpọkatara ndị ụka ya mmadụ isii maka ebubo ịkwa iko, kụọ ha ihe, wụọ ha mmanụ ụgbọala ma mụnye ha ọkụ.
Otu n'ime ndị ahụ bụ Ann Ụzo nwụrụ n'ụlọgwụ n'abalị abụọ nke ọnwa Ọgọstụ ka abalị ole na ole gachara, site n'ọkụ gbara ya, ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ.
A kpụpụrụ Ezeugo ụlọikpe Ukwu dị n'Ikeja Legọs maka ebubo isii gụnyere igbu Ann Uzoh, nakwa ịgbali igbu mmadụ ise ndị ọzọ.
Mana Ezeugo gọrọ, sị na ọ bụ igwe na-enye ọkụ gbara, merụọ ha ahụ mana o wepụtalighị igwe ọ sị gbara n'ụlọikpedịka iheakaebe.
Ọkaikpe kpere ya bụ ikpe bụ Jọstis Olubunmi Oyewole tụrụ Ezeugo mkpọrọ afọ 20, afọ 20 maka mmadụ ise ọ gbaliri igbu nakwa ikpe ọnwụ maka ọnwụ Ann Uzoh.
Ezeugo gbaghara mkpebi ahụ n'Ụlọikpe Mkpegharị nakwa n'Ụlọ Kachasị mana Ụlọ abụọ ahụ kwusiri ike na mkpebi nke ụlọikpe beburu ikpe ahụ.
2. Derico Nwamama, ogbu mma si na mma laa
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ezi aha ya bụ Okwudili Ndiwe, onye Aguleri n'Anambara steeti mana ihe e ji mara ya bụ nwokorobịa a ma ama n'Ọwụwa Anyanwụ maka iji egbe ezu bụ "Derico Nwa Mama".
Ndiwe malitere dịka agboro na-ama aka n'akpa tupu ọ banye otu ndị ojiegbe.
Dịka akụkọ si kwuo, nwa amadia na-eyi ndị Ọwụwa Anyanwụ, ọ kachasị ndị Anambara steeti egwuna-esi abịa awakpo ụlọakụ, ụgbọala 'Lụxurious bụses' na ndị mmadụ n'Ọwụwa Anyanwụ ebe ọ na-abụ ọ kpacha ike, ọ gbalaa Abuja ịkwarị ndụ site na ihe ndị o ritere.
Akụkọ kwuru na n'ọnwa Disemba afọ 2000, na Derico wakporo ụgbọala ogologo n'ụpper Iweka, zuo ha ohi ma gbagbuo ọtụtụ ndị mmadụ, naanị mmadụ anọ ji isi ha pụta.
O mekatara ihe daa ụjọ ahụ gburu ihe ruru ndị uweojii 25 nakwa o pekata mpe ndị nkịtị ruru 100.
Mbọ nile ndị uweojii gbara inwụchi Derico amịtaghị mkpụrụ dịka ụfọdụ ndị mmadụ na-ebo ebubo na nwa amadi ahụ na ọ na-anya isi na o nweghị onye ọbụla nwaanyị mụrụ ga-ejidenwu ya.
Ọ bụ ndị ọrụ nche Gọọmentị Anambara steeti bụ "Bakassi Boys" bụ ndị nwuchiri Derico ma kpụpụ ya n'ahịa Ọchanja, ebe ha nọ n'ọha gbupụ ya isi n'abalị Itoolu nke ọnwa Julai 2001, na-enyeghị ya ohere ịzara ọnụ ya n'ụlọikpe.
3. Eddy Nawgu, arụsị si n'ịga ụka gawa ala mụọ
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ezigbo aha ya bụ Edwin Okeke mana a ma ya ama dịka 'Eddy Nawgu' bụ obodo dị n' Okpuru Ọchịchị Dunukọfịa bụ ebe o hiwere ụlọ ekpere ya ọ kpọrọ 'Anioma Healing Centre".
Ụfọdụ na-ekwu na nwa amadi ahụ agụghị akwụkwọ rue sekọndrị malitere ekpere ya na Jọs Mana nke were anya bụ ọ bụ oge ọ malitere ekpere ya na Nawgu ka ka ha ya malitere ịkpọtụ n' Ọwụwa Anyanwụ nakwa mpaghara ndị ọzọ gbara ya gburugburu.
Ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị ọgaranya na ndị welitere isi n'ọchịchị malitere ije ekpere ya dịka aha ya na-ewu dịka onye na-ebu amụma ma na-arụ ọrụ ebube.
Na-agbanyeghị na nkuzi Nwaamadi ahụ na-akpọ onwe ya “Alusi nna-eje uka” maọbụ “ọkara mmadu, ọkara mmụọ " eyichaghị nkwenye ndị otu Kraistị, ọ dọtara ọtụtụ ndị na-eso ya gụnyere ndị ụka Kraistị bụ sonyere ịga ekpere n'ụlọ ekpere ya.
Mana egwu dagharịrịị nwaamadi ahụ dịka a malitere kpọnyewe aha ya na ndị ọgaranya a na-enyo etu ha si kpata ego nakwa ndị omekome a na-arịa n'obodo.
N'abalị anọ nke ọnwa Novemba afo 2000, aka otu Bakassi Boys, bụ otu ọrụ nchekwa pụrụ iche nke Gọọmentị Anambara Steeti n'oge Ọchịchị Chimaraoke Mbadinuju hiwere n'ihi oke mpụ na nsogbu nchekwa dakwasara steeti ahụ n'oge ahụ, kpara ya.
Ndị dimkpa anya mmemme ahụ gburu Eddy Nawgu n'ihu ọha n'Ahịa Ọchanja Roundabout, dị n'Ọnicha n'abalị Itoolu nke Ọnwa Novemba afọ 2000 maka ebubo aka ya ịdị na ntọ, ibu ọgwụ ike nakwa mpụ ndị ọzọ na-enyeghịya ohere ịkpụ ya ụlọikpe maka ị zara ọnụ ya.
Ka e gbuchara ya,, Gọọmentị Anambara steeti hiwere otu lebara anya na ya bụ okwu mana o nweghị ozi ọbụla otu ahụ wepụtara dịka ihe nchọpụta ha mere n'okwu ahụ.
4. Clifford Orji, onye na-eri anụ mmadụ ka a na-eri 'suya'

A kpọburu ya onye ara n'ihi etu o si adị nkịrịka mana ọtụtụ amaghị na ọ bụ ụzọ Clifford Orji si emesa ndị mmadụ anya n'ihe ọ na-eme.
A nwụchiri nwa afọ Enugwu steeti n'abalị atọ nke ọnwa Febụwarị afọ 1999 dịka a hụrụ nwaanyị a na-achọ achọ ka ọ nọ n'ọnọdụ ọnwụ ka mma n'ebe Orji na-anọ n'okpuru akwa okporoụzọ.
Oge e tuchara gburugburu ebe ọ nọ, a hụrụ anụ mmadụ dị ndị na nke o siri esi, okporoisi mmadụ, akwụkwọ ụlọakụ nakwa ekwentị
Orji kwetara dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu na mkparịtaụka na ya bụ ihe bụ eziokwu na ya na-atọ ntọ, na-egbu mmadụ ma afọ asaa tupu ọ bịa Legos.
Dịka o siri gwa ndị ntakụkọ, “Anyị na-eri anụ mmadụ"
"Anyịegbuola mmadụ atọ bụ ụmụaka ụmụnwaanyị na-ebugharị ahịa."
"Anyị lara ha n'ụdị na anyị chọrọ ịzụ ha ahịa, anyị awakpo ha, gbuo ha were ha mere anụ.
" Onye mụ na ya na-arụ bụ ya na-achụta anụ, ebe m nwe ọrụ ịbọ anụ."
A kpụpụrụ ya n'ụlọikpe Majie dị n'Ebute Meta Legos bụ onye nyere iwu ka e jichie ya n'ụlọikpe dịka ikpe ahụ na-aga.
Ka ọ nọchara afọ 12 na mkpọrọ, n'Eprelu afọ 2012, ọ gbara Gọọmentị Legọs steeti akwụkwọ maka ijichie ya n'ụzọ megidere iwu.
E mechara rịawa ahụ.
Ndị isi ụlọmkpọrọ kwuru na Orji mechara yịwa ara,ma nwụọ n'abalị 17 nke Ọgọstụ, afọ 2012.
5. Evans, Oji ntọrị ndị ọgaranya mere aka ọrụ

N'abalị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ 2022, ụlọikpe mara Chukwudimeme Ohamadike, a ma ama dịka 'Evan' ikpe maka ịkpa nkata ime mpụ na ntọ.
A nwụchiri Evans bụ onye Nnewi n'Anambara steeti n'abalị 10 maka ọnwa Juun, afọ 2017dịka a na-enyo ya maka ntọ na iji egbe ezu ohi na Ọwụwa Anyanwụ nakwa Ọdịda Anyanwụ Naijiria.

Ebe foto si, NPF
A tụrụ Evans na ndị ọzọ gụnyere Uche Amadi na Okechukwu Nwachukwu mkpọrọ maka ịka nkata tọọrọ ndị mmadụ ma napụ ha akatamkpo ego.
Evans kwụpụtara n'eziokwwu na aka ya dị na ntọ ndị nnukwu mmadụ Legọs,Onicha, Aba nakwa Pọtakọt.
Ndị danyere n'aka Evans gunyere otu ọgaranya a kpọrọ, Donatus Dunu, bụ onye nwe ụlọrụ na-eme ọgwụ dị na Ilupeju, Lagos ma napu ezịnaụlọ ya ego dị N150m mana ha jụrụ ị hapụ ya, gbaa isi akwara na ha ga-akwụ N500, tupu nwoke ahụ ahụ ogbere gbalahụ ndị ntọọ ahụ.
N'afọ 2013, ọ gbalịrị ịtọrọ onye nwe ụlọrụ ụgbọala njem,"The Young Shall Grow Motors".
6. Vincent Duru na 'Otokoto Hotel'- ụlọ nkwarị ghọrọ ụlọ mgburi

Otokoto Hotel bụ ụlọ nkwarị a ma ama ma na-akpọtụ n'Owere n'agbata afọ 80s na 90s maka ikpori ndụ.
Mana ntọrị na ogbugbu nwata na-ere ọpapa aha ya bụ Ikechukwu Okoronkwo n' abalị 19 nke ọnwa Septemba afọ 1996 bụ mmalite ọgwụgwụ ya.
Ọnwụ Ikechukwu ghọrọ ikuku fere nke mere ka a hụ ike ọkụ dịka ọ gbara onye nwe ụlọnkwari ahụ bụ Vincent Duru na ndị ọrụ ya dịka ndị ogbu isi.
Akụkọ kwuru na ọ bụ otenkwụ nọ n'elu nkwụ hụrụ ka e gbupụrụ nwata ahụ bụ onye gbara ama ihe ọ hụrụ n'elu nkwụ.
Ekeanyanwu bụ lara Ikechukwu sị na ọ chọrọ izụ ọpapa ọ na-ere, kpọba ya n'ime ụlọngwarị ahụ ,nye ya mmanya e chere e tinyere ọgwụ, ọ ṅụọ,e were gbuo ya.
Ọnwụ nwata ahụ kpalitere iwe ndị Owere bụ ndị rịalara nsogbu ntọri na ofufu ndị mmadụ ogologo oge dịka ha boro ndị uweojii na gọọmentị ebubo ịnọ n'ụlọ ewu amụọ n'ọgbụrị.
Ha malitere ngagharịiwe ma mebie ọtụtụ ụlọ, ọdọahịa na ihe ndị ọ gara anya a na-enyo naka ha dị na mpụ dịka ha na-akpọ oku ikpe nkwụmọtọ.
Ọgbaghara ahụ mere ka ndị uweojii nwụchie Vincent Duru e ji 'Otokoto' mara , nwa ya nwoke bụ Obicheozor, onye ọrụ ya bụ Ekeanyanwụ(onye gbupuru isi Ikechukwu) na ndị ọzọ ma kpụpụ ha ụlọikpe maka ebubo ntọ na ogbugbu Ikechukwu Okonkwo.
Ụlọikpe nke Jọstis Chioma Nwosu-Iheme nọ n'isi mara Duru na nwa ya nwoke bụ Obicheozor ikpe ọnwụ n'afọ 1996 maka ogbugbu Ikechukwu mana ọ bụ n'afọ 2016 ka ọ nọchara afọ 20 n'ụlọmkpọrọ ka e mezuru mkpebi ụlọikpe site n'ịkwụgbu ya dịka Gọọmentị Imo binyere aka n'akwụkwọ maka ọnwụ ya.
7. Emmanuel Nwude: Oresịrị nwa Bekee ọdọụgbọelu na-adịghị adị

Emmanuel Nwude bụ onye bụbụ direktọ n'ụlọakụ 'Union Bank' mere ka ọ bụ onyeisi Ụlọakụ Etiti nke Naijiria (CBN) oge ahụ bụ Paul Ogwuma ma sị etu ahụ ghọrịa ojiegoachụego onye Japan bụ Nelson Sakaguchi, nke bụ direktọ ụlọakụ mba of Brazil a kpọrọ 'Banco Noroeste'.
Nwude kpọrọ Sakaguchi, gwa ya na a chọrọ ịrụ ọdọụgbọelu n'Abuja, ya gbazinye ego a ga-eji arụ ya, na ọ ga-enweta ọmụrụnwa dị mma site na ya. N'agbata afọ 1995 na 1998 , nwa amadi ahụ kwụtara ego ruru nde dọla 242 na-enyochaghị ma ihe Nwude gwara ya ọ bụ eziokwu.
Ọ bụ n'afọ 1997 ka ụlọakụ ahụ chọpụtara n'agwọ nọ n'akịrịka dịka ha na-enyocha ego ha mefuru were hụ n'akatamkpo ego ha dị na mba Cayman Islands.
A nwụchiri Nwude na ndị otu ya ma kpụpụ ha ụlọikpe n'afọ 2004
E bokwara Nwude ebubo ịtọrọ ndị akaebe n'ikpe ya nakwa ịgbalị inye onyeisi ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka bụ 'Economic and Financial Crimes'(EFCC) oge ahụ bụ Nuhu Ribadu akaazụ ego dị puku dọla 75($75,000).
E mechara tụọ ya mkpọrọ afọ 25 ma napụta ya ụfọdụ akụ o ji ego ụlọakụ ahụ kpata ma nyeghachị ụlọakụ ahụ mana a tọhapụrụ ya n'afọ 2006.
8. Shina Rambo

Mathew Oluwanifemi e ji 'Shina Rambo' mara bụ ojiegbe ezu ude ya dere na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Naijiria n'agbata afọ 90s.
E ji ịwakpo ụl;ọakụ nakwa ịnapụ ndị mmadụ ụgbọala dị oke ọnụahịa mara nwa amadi ahụ.
Shina Rambo bụ onye omekome ma ndị mmadụ ma ndị uweoji na-eze ndụ n'oge ọ chị ọgbọ dịka ọ na-ememila onye ọbụla nọchiri ya ụzọ imezu ebumnobi ya.
Ebubo e boro gụnyere ike si n'ọtụmakpọ nakwa iji mmadụ agba aja dịka o nwere nkwenya na ọdeshi.
Maka aka mechara kpara onye arụrụ ala.
A nwụchiri Shina Rambo ma tụọ ya mkpọrọ.
Mana o chegharịrị n'ụlọmkpọrọ nabata Kraisti.
E mechara tọhapụ ya n'oge ọchịchị Onyeisiala Olusegun Ọbasanjo.
9. Anini

Aha ya bụ Lawrence Nomanyagbon Anini ,mana ihe e jiri mara ya bụ Anini.
Anini kpara ike na mpaghara Bini n'agbata 80s dịka onye ojiegbeezu.
Ihe aha Anini ji kpọtụ akpọtụ bụ na o ghọrọ ikuku ama n'ọnya, a ma ihe ndị uweojii emela, ha anaghị ejideliya dịka ọ na-agagharị n'akpa mkpa mkpa n'ịnapụ ndị mmadụ ihe ha nwere.
Mana iko ya juru n'abalị atọ nke ọnwa Disemba afọ 1986 ebe o zoro n'otu ụlọ ọ nọ agwọ mgbọ egbe atụrụ ya n'ụkwụ.
Akụkọ kwuru na ọ bụ enyi ya nwaanyị taara ya ma mee ka nkata kpudo ya.
Onyeisiala mgbe ahụ bụ Ibrahim Babangida nyere ntuziaka ka e kpee ya ikpe ngwangwa.
A mara ya ikpe ọnwụ maka ihe o mekọtara ma gbuo ya n'abalị 29 nke ọnwa Maachị afọ 1987.











